Ibrahim Zakzaky: 'Mba India nyere m awa abụọ ịpụ ala ha'

Ibrahim El-Zakzaky kwuru na gọọmentị Naijirịa gwara mba India na ha amaghị ihe na-eme ya mana nke a bụ asị.
O kwuru na ọ bụ ọgwụgwọ ka ọ biara ịnata n'India, n'ihi na e mechaala ya nnyocha na Naịjirịa.
El-Zakzaky zaghachịrị akwụkwọ gọọmentị Naịjirịa depụtara site n'ihe onyonyo o wepụtara n'India, ebe ya bụ Zakzaky kwuru na gọomentị India nyere ya naanị awa abụọ ịpụ ala ha ma ọ bụrụ na o kwenyeghị n'ihe gọomentị Naịjirịa kwuru.
O kwuru na ọ bụghi ya họpụtara ụlọọgwu ọ nọ n'India "n'agbanyeghị na ụlọikpe Naịjirịa ekwetela n'ụlọọgwụ ndị dọkịnta ya họpụtara ka ọ gaa n'India"
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
N'aka nke ọzọ, gọọmentị etiti nke Naịjirịa na-ekwu na ha anabataghị akwa onyeisi ndị "Islamic Movement of Nigeria" bụ El-Zakzaky na-ebe na-ekwu na ọnọdụ ya n'ụlọogwu ọ nọ n'India ka njọ karịa nke dị na Naijirịa.
Akwụkwọ Grace Gekpe onye bụ odeakwụkwọ Ministrị na-ahụ maka Mgbasaozi na Ọdinala nke Naịjirịa depụtara, kwuru na El-Zakzaky bidoro kpawa agwa na-ezighị ezi mgbe ha rutere Dubai ebe ha si gawa India.
Akwụkwọ a kwuru sị na ọ bụ El-Zakzaky ji aka ya họpụta ụlọọgwụ ọ chọrọ n'India, ma ndị ndu ga-echekwa ya, ma tinyekwa ndị dọkịnta so ya gaa.
Gekpe sị na " O kwuru ka e nye ya akwụkwọ-ikike-ngafe ya, mana ndị gọọmentị ha na ya so ekweghị, agwa ya bịara kawa njọ mgbe o ruru India mgbe ọ na-ekweghị ka e mee ya nnyocha ahụ"
Akwụkwọ a kwuru na " Ọ chọro ka e nye ya ohere ịgagharị etu ọ siri chọọ, kwuokwa ka etinye ya n'ụlọobibi na ọṅụṅụ nke dị okeọnụ ma chọọkwa ka o jiri aka ya họpụta ndị dokinta ga-elete ya anya n'ụlọọgwụ Medenta, India, mana nke a megidere ụkpụrụ ndị ọgwụgwọ".
Ihe ndị a El-Zakzaky na-achọ mere ka ndị ụlọọgwụ India wee iwe ma kwuo na ha dị njikere ịkpọlata ya Naịjirịa.

Ebe foto si, IMN
Gekpe kwuru sị na ndị mba India si na ọ (El-Zakzaky) gaghị atụrụ ha ihe ha ga-eme, ma kwuokwa na ha agaghị enye ya ohere ime ihe ọbụla gbasara otu ya n'India.
Gọọmentị Naijirịa arịọla gọomentị India mgbaghara maka agwa ọjọọ ha sị na El-Zakzaky kpasoro ha.
Gekpe kwuru na gọọmentị dị njikere ikpe El-Zakzaky ikpe otu o ziri ezi ma ọ lọghachị Naijiria.
O kwukwara na akwa El-Zakzaky na-ebe na ọnọdụ ya n'India ka ọnọdụ ya na Naịjirịa njọ, bụ mmiri awụrụ n'okwute.
Akụkọ ka na-abịa.
Lee akụkọ ga-amasị gị
Lee ihe nkiriga-amasị gị









