CBN Nigeria: Kedụ etu mmachi dọla azụmahịa ga-esi metụta gị?

Naịjirịa bụ ala a ma ama na-atụbata ụfọdụ nri dịka mmanụ nri, azụ mkpọ, azụ frij, nnu, shuga wdg.
Nke a mere na iwu onyeisiala Naịjirịa manyere ịkwụsị ịnye ndị na-atụbata nri dọlla azụmahịa ga-emetụta ọtụtụ nri.
Muhammadu Buhari kọwara na o mere nke a n'ihi na Naịjirịa etozuola ịkọpụta nri onwe ya.
Mana onye ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba obodo bụ Ugochukwu Obi-Chukwu kwuru na atụmatụ a agaghị emetụta nri ka ndị mmadụ si eche.
O kwuru na ọ ga-ete obere aka tupu mmetụta ọ metụtara nri apụta ihe n'ihi na dọla a na-enye ndị na-atụbata nri ebughị ibu na mbụ.
Nri ndị nwereike itinye ego
Nri nwa

Ebe foto si, Getty Images
Mmanya ike

Ebe foto si, Getty Images
Ngwa nri

Azụ frij

Mmiri ala ehi

Ebe foto si, Getty Images
Mmanụ nrị

Ebe foto si, Getty Images
Appụlụ na mkpuru osisi ndị ọzọ

Nri ndị ọzọ:
- Mmanya dị icheiche
- Shuga
- Okporoko
- Mmanụ anwụ
- Ọka
- 'Wheat'
- Ntụ e ji eme achịcha Bekee (Flour)
- Mmanụ ọpapa
Ugochukwu Obi-Chukwu kwuru na ihe na-enye ndị mmadụ oke echiche bụ etu onyeisiala si manye ya bụ iwu n'enweghi ebe o jidere aka
Ọ gwara BBC Igbo n'ekwentị na nke ahụ ga-eme ka ndị mmadụ chịrị aka n'obi n'ihi na ha agaghi enwe ntụkwasiobi ebe onyeisiala nọ.
N'ọnụ ya, "Onyeisiala agwabeghi anyị ihe bụ "nri" o kwuru na iwu a ga-emetụta"
Nke a pụtara na o nwereike imetụta ngwa e ji arụpụta nri ma chekwaa ya.









