El-Zakzaky: Onyeisi ndị Shia ahapụla Naịjiria taa gawa India

Sheikh Zakzaky
Nkọwa foto, Ibrahim El-Zakzaky

Onyeisi otu ndị 'Islamic Movement in Nigeria' bụ Ibrahim El-Zakzaky na nwunye ya ahapụla Naịjirịa taa bụ Monde gawa India.

Femi Falana, bụ onye ọkaiwu na-anọchite El-Zakzaky gwara BBC na mkparịtaụka ekwentị na Zakzaky ga-ebili njem taa.

Mana ihe onyoonyoo nke ndị IMN wepụtara na mgbede Mọnde gosiri ebe onyeisi ha bụ El-Zakzaky nọ n'ime ụgbọelu.

El-Zakzaky

Ebe foto si, IMN

Nkọwa foto, Ibrahim El-Zakzaky n'ime ụgbọelu bu ya aga India

Nke a bụ iji rube isi na mkpebi nke ụlọikpe dị na Kaduna nyere n'abalị ise nke ọnwa Ọgọst.

Ụlọikpe ahụ kwukwara na otu onye nnọchite anya gọọmentị etiti nakwa gọọmentị Kaduna steeti ga-eso El-Zakzaky na nwunye ya mee njem a.

Nke a bụ iji hụ na ha lọtara ngwa ngwa ha natachara ọgwụgwọ.

Mana gọọmentị Kaduna Steeti kwuru na ha ga-agbagha mkpebi ahụ.

El-Rufai na El-Zakzaky

Ebe foto si, El-Rufai/ Facebook

El-Zakzaky na nwunye ya anọọla ihe karịrị afọ atọ n'aka ndị ọrụ nchekwa nzunzo a na-akpọ 'Department of State Services', DSS.

A nwụchiri El-Zakzaky na nwunye ya n'ọnwa Disemba 2015 mgbe ọgbaaghara dapụtara n'etiti ndị agha na ndị otu IMN na Zaria, Kaduna Steeti.

Ụfọdụ ndị ọkaikpe enyebuola iwu ka atọhapụ El-Zakzaky.

Ndị otu IMN bidoro mewe ngagharịiwe na steeti dị icheiche n'ihi onyeisi ha e ji.

Ngagharịiwe ndị Shiite

Ebe foto si, Ibrahim Musa

Nkọwa foto, Ngagharịiwe ndị otu IMN tara isi ọtụtụ n'ime ha.

Ngagharịiwe nke e mere n'ọnwa Julaị tara isi ọtụtụ ndị IMN tinyekwara otu onye uweojii na otu onye ntaakụkọ.

Nke a mere ka gọọmentị machie otu ahụ ma kpọọ ha 'otu na-eyi ndụ egwu' n'ọnwa Julaị.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Lee ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, 'Ihe na-agbata m n'uche bú maóbú etu ka m ga-esi laa' - Onye ndị ntọrị nwụchịrị