Enugu Murder: Aka akparala nwoke gburu ma lie enyi ya nwoke n'ọhịa

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ dị mkpa taata

Ebere Amaraizu
Nkọwa foto, Ebere Amaraizu, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Enugwu

Ndị Uweojii Enugwu Steeti anwụchiela onye ọrụ ubi a sị na o gburu enya ya nwoke o ji ụgwọ ma lie ozu ya n'ime ọhịa.

Nwoke a aha ya bụ Samson gburu enyi ya nwoke aha ya bụ Friday mgbe ọ gara ịgba ya ụgwọ uru ha ritere n'ahịa ha zụkọrọ.

Dịka Ebere Amarizu, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu Steeti siri kwuo, Samson na Friday na onye ọzọ aha ya bụ Paul tụkọtara ego wee zụta mkpụrụ 'Cucumber' ha ga-akọ.

Ma mgbe oge owuwe ihe ubi ruru, Friday amaghị mgbe Samson ji gaa ghọrọ 'Cucumber' ndị ahụ ree.

Mana Friday gakwuru Samson n'ubi ka ọ gbaa ya ụgwọ oke ego ya, Samson wee gbuo ya ma lie n'ime ọhịa.

El-Zakzaky e feliela

El-Zakzaky

Ebe foto si, IMN

Nkọwa foto, Ibrahim El-Zakzaky n'ime ụgbọelu bu ya aga India

Onyeisi otu ndị 'Islamic Movement in Nigeria' bụ Ibrahim El-Zakzaky na nwunye ya ahapụla Naịjiria taa bụ Monde gawa India ịga leta ahụike ha.

Gọọmentị tọhapụrụ Elzakzaky bụ onye e ji kamgbe 2015 iji rube isi na mkpebi nke ụlọikpe dị na Kaduna nyere n'abalị ise nke ọnwa Ọgọst.

E liela ndị nnyocha sayensị mba Russia lara mmụọ

Explosion

Mba Russia etunyela mmadụ ise bụ ndị ọkacha mara na nnyocha sayensị ugo 'Dike obodo ji aga mba' dịka ha tufuru ndụ ha mgbe ha na-eme nnyocha gbasara igwe ọkụ 'nuclear'.

Mmadụ ise ndị ahụ lara mmụọ oge akụrụngwa ha ji eme nnyocha gbara n'abalị asatọ nke ọnwa a.

E mere olili ndị ọkacha mara ahụ n'obodo Sarov taa bụ Monde

Sam Okwaraji

Sam Okwaraji

Ebe foto si, VON

Ọ bụ ụbọchị Monde a mere ya afọ iri atọ Sam Okwaraji dara wee laa mmụọ n'ama egwuregwu Naịjirịa di na Legọs dịka ndi ọtu egwu bọolu Naijirịa zutere mba Angola.

Okwarajị dị afọ iri abụọ na ise mgbe ọ lakwuru chi ya na Legos.

Nigeria vs Ukraine

Nigeria

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Super Eagles nke Naijiria

Ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles ga-ebido nkwado maka iko mba Afrịka nke afọ 2021 mgbe ha na ndị mba Ukraine ga-ezute n'asọmpi enyi na enyi.

Onyeisi egwuregwu bọọlụ na Naijiria bụ Amaju Pinnick kwuru na asọmpi a ga-adị n'obodo Kiev n'abalị iri nke ọnwa September afọ a.

Gee nkeji BBC ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, 'Ihe na-agbata m n'uche bú maóbú etu ka m ga-esi laa' - Onye ndị ntọrị nwụchịrị

Serena Williams

Serena kwara akwa arịrị

Ebe foto si, Getty Images

Olilanya Serena Williams ịnwụchịto iko Gram Slam nke iri abụọ na anọ ya ka bụkwa ugwu nyịrị ya ịrị.

Williams ji akwa wụsa ọwa ka azụ mgbụ ekweghị ya mgbe ya na Bianca Andreescu zutere n'asọmpi nke ikpeazu nke Rogers cup n'ụbọchị Sọnde.

Serena Williams meriri Marie Bouzkova nke mere ka otozuo izọ asọmpị nke ikpeazụ Rogers Club.

Williams, onye gbara afọ iri atọ na asaa n'afọ a, enwetabeghị ntụrụugọ kemgbe o si ezumike imụnwa laghachị n'afọ 2018.

Dịka o si dị, ọ gwara ndị na-akwadọ ya sị "Afọ a siri anyị ike kama olileanya dị".

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ihe mberede okporo ụzọ eriela isi mmadụ iri abụ n'Bauchi Steeti

Ugboala gbara ọkụ

Ebe foto si, Lasema

Nkọwa foto, Ugbọala J5 na 'Hummer bus' kwakọro isi nke riri ndụ mmadụ iri abụọ

Ọkụ si n'ihe mberede okporo ụzọ taala isi mmadụ iri abụọ na anụmanụ iri asatọ n'Bauchi Steeti.

Ọnụ na ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Kamal Abubakar kwuru na ihe a mere dịka ụgbọala J5 bụ ewu na ụgbọala bu mmadụ kwakọrọ isi n'uzọ si pokistum gawa obodo Sade.

Abubakair kwuru na nke a mere n'elekere itoolu na ọkara nke abalị n'ụbọchị Satọde.

Akwa arịr na Mba Tanzania

Ndị bụ ozu
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ biara i mata nke bụ ozu nwanne ha

Akwa arịrị na-ada na Tanzania ka ha lichara ọtụtu n'ime mmadụ iri asaa na otu ọkụ mmanụ ụgbọala gbagbụrụ n'ụbọchị Satọde.

Mmadụ iri ise na ịtoolu merụrụ ahụ na meberede ahụ mere dịka ha na-ekụrụ mmanụ ebe gwomgworo mmanu daara.

Onyeisiala Tanzania bụ John Magufuli ehiewela ụbọchị ato dịka ụbọchị iruuju ma rịọ ndị mmadụ ka ha zeere gwomgworo bu mmanu ụgbọala mgbe ọbụla ọ daara.

Akụko Ga-Amasi Gị