Sam Okwaraji: Ihe agaghi eji chefuo nwaafọ a

Sam Okwaraji

Ebe foto si, VON

Nkọwa foto, Ọ gụrụ akwụkwọ dịka ọkaiwu ma nwekwaa nke Bekee kpọrọ "Masters" n'ime agụmakwụkwọ ndị ọkaiwu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Taa ka o mere afọ iri atọ na otu (31) ọkwụrụ aka ndị Igbo nwere n'egwu bọọlụ bụ Sam ọkwaraji dara n'ọgbọ egwuregwu nwụọ.

Ụbọchi 12 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1989 bụ oge Sam Okwaraji gara ọgụ ikpeazụ ya.

Ọgụ Okwaraji abụghị nke e ji mma na egbe alụ, ọ bụ n'ama egwuregwu, mana e ji uwe egwuregwu Naịjirịa lụọ ya.

N'ụbọchị ahụ Okwaraji dara, ọ fọrọ naanị nkeji 30 ka a gbachaa bọọlụ ahụ Super Eagles na Angola na-agba iji ahọpụta ndị ga-aga Iko Mbaụwa nke afọ 1990.

E buru ya gawa ụlọọgwu ebe ndị dọkịnta sị na ọ nwụọla.

Ihe Okwaraji ji bụr ọpụrụiche

N'ime foto a ndị NFF tinyere na Twitter Okwaraji bu onye nke ato site n'aka nri

Ebe foto si, @thenff

Nkọwa foto, N'ime foto a ndị NFF tinyere na Twitter, Okwaraji bu onye nke atọ site n'aka nri na ndị tukwu ala

Ndị amaghị maka ya nwereike na-asị na ọ bụ sọsọ ọgba bọọlụ mana ọ bụ sọsọ ihe ọ na-eme n'ama egwuregwu ka e ji mara nwaamadị a?

A mụrụ Okwaraji n'ụbọchị 19 nke ọnwa Mee 1964 n'Owere-Umudioka dị n'okpuruọchịchị Orlu dị n'Imo steeti.

Ebe ọtụtụ ndi na-agba bọọlụ adịghị abụ ndị na-agụsi akwụkwọ ike, Okwaraji ji asambodo ọkammụta n'ihe banyere ịbụ ọkaiwu. Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum dị n'obodo Rome dị na mba Itali.

A ma ya ka onye hụrụ mba ya n'anya ọfụma, nke mere ọtụtụ oge ọ na-agbara onwe ya ụgbọ gaa ebe ọ ga gbara Naịjirịa bọọlụ.

Okwaraji gbaara Naijirịa bọọlụ ugboro asatọ ma nye otu goolu.

Mgbe otu egwuregwu bọọlụ ọ na-agbara bọọlụ mgbe ahụ sị na ọ gaghị agara Naịjirịa asọmpi, Okwaraji sara ha okwu mere ọtụtụ mmadụ jiri kpupuru ya okpu.

Ọ sị; "Abụ m ọkaiwu. Dịka unu ma, ebinyere m aka ịgbara unu bọọlụ, mana echeghị m na ọ ga-egbochiri m ịza oku obodo m. Unu agaghị akwụsị m ịgbara mba m bọọlụ. Ka m gwa gị, aga m aza oku mba m ma unu achọrọ ya, ma unu achọghị ya."

Na nkwanyeugwu, gọọmentị Legọs hibere nka Okwaraji n'afọ 2011 n'ama egwuregwu ebe ọ nọ lụọ ọgụ ikpeazụ ya; National Stadium nke dị na Surulere.

Mgbe ehibere ihe nka Sam Okwaraji

Ebe foto si, Lagos state government

Aka chịburu Imo Steeti bụ Achike Udenwa, gụkwara ama egwuregwu dị n'Orlu, Imo steeti bụ obodo o si, aha Okwaraji iji cheta ya.

Ndị egwu jikwa aha ya gụọ egwu.

Ihe gburu ya bụ ọrịa obi.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasịkwa gị:

Aha onyonyo, Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ