Tekno Agege: 'Anyị ga-ezi Tekno ihe ọkụ ji ntị oke eme' - NCAC

Tekno

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ngalaba National Council of Arts and Culture (NCAC) ọrụ ha gụnyere ikwalite egwu na Naịjirịa eforola ntụntụ taa ma kwuo na ha ga-eji Tekno mara ndị oti egwu ọzọ chọrọ ikpa agwa ezeghiezi atụ.

Onyeisi NCAC bụ Olusegun Runsewe kwuputara nke a maka ihe onyonyo gosiri Tekno na ụmụnwaanyị yi mbeleukwu na-agba egwu n'ime ụgbọala n'okporo ụzọ Lekki dị na Legọs steeti.

Maazị Runsewe kpọrọ ihe Tekno mere 'ihe megidere nchekwa obodo"

O na-akọwakwa sị "ịgba ọtọ abughị omenala anyị nke mere na anyị agaghi anabata ya ma ọlị".

Runsewe sị ka gọọmentị chọpụta ndi niile nwere ebe a na-agba ọtọ agba egwu ka enwee ike ijide ndị na akwado ha ma gbaa ha ikpe.

Cheta na ihe onyonyo wuru na soshal midia na-egosi ụmụnwaanyị yi bante agba egwu n'ime ụgbọala.

Tekno mechara kwuo na ọ bu ya na ụmụnwaanyị ahụ so, ma wepụtakwa ihe nkiri egwu ya ha na-eme mgbe ahụ.

Ọ bụ ndị na-agafe n'ụzọ sere ya bu ihe onyonyo ma tinye ha soshal midia.

Runsewe sị na ọ bụ ebele ka emere Tekno maka ahụ adịghị ya mma.

Na-ikwu na Tekno megidere usoro ejiri hapụ ha, ọ sị: " Anyi ga-eji ya gosi ndị ọzọ ihe ọkụ ji nti oke eme n'ihi na gọọmenti a agaghị anabata mpụ na agwa rere ure. Ihe bụ ihe gọọmentị kwesiri ịkwụsịike na ya."

Ọ bu n'ụbọchị atọ nke ọnwa Ọgọstụ 2019, ka ndị mmadụ hụrụ ụgbọala bu Tekno onye ezigbo aha ya bụ Augustine Kelechi na ụmụnwaanyị na-eyichighi ahụ na-agba egwu n'okporoụzọ Lekki, Legọs steeti.

Eboro ya ebubo ikwalite ọgbọ ebe a na agbaọtọ agba egwu, kama Tekno kwuru sị na ọ bụ ọrụ ka ya na ndị otu ya n'arụ.

Tekno na onwe ya rịọrọ mgbaghara n'igwe Instagram ya ma kwuo na ọ bụghị mgbasaozi maka ebe ụmụnwaanyị na-agba ọtọ agba oringo ka ha na-eme.

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ihe a Runsewe kwuru

@Matilda_Duncan onye mgbasa ozi nke Redio jụrụ "kedụ ebe mkpa obodo anyị dị, kedụ ebe Hamisu Wadume nọ, Leah ọnwụrụ anwụ", dgz.

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2

Onye oti egwu Peter Okoye mara njakịrị sị " I bụ nsogbu megide nchekwa Naịjirịa. Dika fufu na Garri kwuru (FG)...ngwa, anyị chọro anụ ewu".

Skip Instagram post, 3
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 3

@Oluomoofderby kwuru na kama gọomenti etiti ka amata ndị gburu ndị uweojii atọ ha na achụharị Tekno.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Onyekachi Okorie sị na okwu a enweghị ịsi, Tekno bụrụ nsogbu na nchekwa Naịjiria keduzie maka ndị ntọrị, ndị ohi, Nde ọchịehi na Boka Haram.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Akụkọ ka na-abịa.

Akụkọ Ga-Amasi Gị

Lee Ihe Nkịrị Ga-Amasị Gị

Aha onyonyo, 'M bụrụ anwụ anwụ, m ga-agakwuru Boko Haram nwee mkparịtaụka udo' - Klint da drunk