Rugged Man: Ihe onyonyo na-ewu na soshal midia o gosiri ka awakporo oti egwu a na London?

Rugged man

Ebe foto si, Rugged Man/ Instagram

Nkọwa foto, Rugged Man na-etinyeka ọnụ n'ihe banyere nchekwa na mpụ na nrụrụaka
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Oti egwu ama ama bụ Michael Ugochukwu Stephens eji Rugged Man amara tinyere ihe onyonyo n'akara Instangram ya ọ sị na-egosi ka ndị ọ sị bụ ụmụ okoroọbịa anọ na-awakpo ya.

N'ime ihe onyonyo ahụ, ụmụ okoroọbịa ruru anọ na-akụ otu onye ihe ma dọka akwa ya.

Ihe a mere n'ụlọ nrị akpọrọ 805 mere n'ọchịchịrị, nke mere BBC Igbo enweghị ike ịsị na ọ bụ Maazị Stephens bụ onye a na-awakpo na ya.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

N'iji mata nke bu eziokwu, BBC Igbo kpọrọ ekwentị Rugged Man nke otu onye nyere aha ya ka Victor zara, were si na akụkọ akpụ n'ọnụ bụ eziokwu.

Ọ sị; "Awakporo Rugged Man n'ezie na Lodon, mana onweghi ihe ọzọ anyị chọrọ ikwu maka ya ugbua. Anyị ga-ewepụta ozi mgbe na-adịe anya."

Agbanyeghị na onye nhazi ya ekwubeghi ka ahụ dị ya ugbua, Rugged Man zipuru ozi ekele nye ndị na-akwado ya n'akara ya ma na-asị na ya dị mma.

Na sosal midia, ụtụtụ mmadụ na-ekwu na ọ bụ maka okwu Rugged Man kwuru banyere onye oti egwu akpọrọ Naira Marley butere ya mwakpo a.

Cheta na Rugged Man tinyere ọnụ n'okwu Naira Marley kwuru maka mpụ Yahoo Yahoo tupu aka ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kpara oti egwu ahụ.

Naira Marley on May 20 for

Ebe foto si, Economic and Financial Crimes Commission

Nkọwa foto, Naira Marley

Naira Marley na onwe ya nọbụ na mkpọrọ mana akụkọ na-ekwu na ọpụtala.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post