AMCON Debtors List: 'Ihe mere aha anyị ji dị na ndị ji gọọmenti ụgwọ'

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Buhari enyela ngalaba Gọọmentị dịka AMCON,ICPC na EFCC inyocha obaego niile ndị ji AMCON ụgwọ

Onyeisiala Naijịrịa bụ Muhammadu Buhari agbanweela iwu nke nyeziri ngalaba n'ahụ maka igba ụgwọ ikike i gwa ndị ụlọakụ ka ha nye ha ohere inyocha obaego ndị niile ji gọọmentị ugwọ.

Ngalaba gọọmentị ndịa bụ Asset Management Corporation of Nigeria (AMCON) , Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), Nigerian Financial Intelligence Unit (NFIU) na kwa Independent Corrupt Practices Commission (ICPC) .

Gọọmentị na agba mbo inatacha ụgwọ eji AMCON mana iwu ochie nke agbanwere ugbua enyeghị ha ikike ha chọrọ.

Mana ka ọ dị ụgbụ a, ha enwtala ikike ha chọrọ.

AMCON edepụtala akwụkwọ na mbụ nke gosịrị aha ndị jị ha ụgwọ, BBC gbara otu n'ime ha ajụjụ ka ọ gwa anyị uche ya.

Ugo Egboji - Petrologistics Limited

Ugo Egboji onyeisi ụlọọrụ Petrologistics gwara BBC otu iwu ọhụru a sịrị metuta ya.

O mere ka anyị ghọta na:

Ugo Egbujo
Nkọwa foto, "Iwu a dị mma maka na ọ ga-eme ka AMCON nata ụgwọ eji ha" Egbujọ

1) "Ụgwọ a e ji bụ ụgwọ e ji ndị ụlọakụ"

2) "Ọtụtụ ụgwọ a bụ nke sitere na mgbere akụ ụlọọrụ na-ere mmanụ agbidi nke a gbara n' ụlọ mgbere ahịa a kpọrọ "Stock Market."

3) "Dịka Naịjirịa nwere ọtanisi(Recession) n'afọ 2008 nke metụtara ọtụtụ ụlọọrụ, gọomentị kwesiri ili ụlọọrụ ndị a, ihe Bekee kpọrọ 'Liquidation," dịka a na-eme na mba ndị ọzọ."

"Mana ha emeghị ya n'ihi na gọọmentị achọghị ka ụlọakụ ga daa."

4) "Ndị ji ụgwọ a karịrị puku ise"

5) "AMCON na-eme ka ọ dịrị gọọmentị mma, ọ dịrị ụloakụ mma ma dịkwara ndị ji ụgwọ mma."

6) "N'agbanyeghị nke a, e nwere ndị na-achọghị ikwu ụgwọ a ma ncha."

7) "Aha e deputara na Intanetị nsonso a bụ ọrụ ndi ntaakụkọ umengwụ n'ihi na aha ndị a bụ aha ochie e depụtara."

8) "E depụta aha ndị ji ụgwọ ọhụrụ i ga ahụ na ọbụghị aha niile ka i ga ahụ na ya."

Dika ihe a si gbasata iwu, Okaiwu bụ Nwabufo Ikechukwu kọwara na ọ bụghi nani onyeisiala denyere atụmatu a n'iwu, kama ndị Omeiwu ga eweputa iwu tupu onyeisiala edenye ya n'iwu Naịjiria.

Nwabufo Ikechukwu

Ebe foto si, Nwabufo Ikechukwu

Nkọwa foto, 'Ọ bụ ndị Omeiwu ga-ebụ ụzọ gbanwee iwu tupu Onyeisiala edenye ya n'iwu.' Nwabufo

Nwabufo gara n'ihu kọwaa kwa na iwu a bụ ndezighari iwu AMCON nke di bụ mbụ.

O gara n'ihu kọwaa na tupu edegharia iwu a, ndi gọomenti enweghi ikike igwa ndi uloakụ ka ha nye ha ohere i nyocha ma banye obaego ndia ji ụgwọ.

O kwuru na iwu ọhụrụ a ga enyezi ndị gọọmenti ikike inyocha obaego ndia ji ugwọ na enweghi mgbochi obụla dika iwu ochie AMCON na egbochi ha.

Nwabufo gwara BBC na n'uche obi ya, iwu a bụ ezigbote ihe, kama ka a n'ele ma ọ bụ otu nri si esi ka ọ ga esi tọọ.

Lee Akụko Ga-Amasị Gị -

Lee Ihe Nkịrị Ga-Amasị Gị -

Aha onyonyo, Lee nwaafọ Igbo zọtara ọkwa ọchịchị ugboro atọ na Belgium