Ifeanyi Ubah: SEC amachịbeghị Capital Oil

Ifeanyi Ubah onye nwe Capital Oil

Ebe foto si, @FCIfeanyiUbah/Twitter

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Otu onye ọkachamara n'ihe gbasara azụmahịa nakwa akụnaụba obodo bụ Ugochukwu Obi-Chukwu agwaala BBC Igbo na SEC amachibeghi Capital Oil.

Ụlọntaakụkọ dị icheiche na-ebu akụkọ na SEC bụ ngalaba na-ahụ maka ego ahịa na Naịjirịa amachiela Capital Oil nke Ifeanyi Ubah nwe maka mpụ ego ruru ijeri naira ise.

Mana Obi-Chukwu kwuru na ọ bụ ndọmọdụ ka ụlọomeiwu nyere SEC, gwa ha machie ya bụ ụlọọrụ ahụ n'abụghị na-amachiela ya.

O kwukwara na SEC ga-amalite ịme nyocha nke ha maka ebubo a eboro Capital Oil tupu ha amara ihe ha ga-eme maka ya.

"SEC nwere ikike ị chụsasị ndị isioche Capital Oil maọbụrụ na ebubo ahụ bụ eziokwu mana ha ga-eburu ụzọ mee nyocha" ka Obi-Chukwu kwuru.

Cheta na n'ime akwụkwọ ozi AMCON bụ ngalaba na-elekọta akụnaụba ndị na-azụ ahịa wepụtara n'abali abụọ gara aga, aha Ifeanyi Ubah bụ nke mbụ na ndị kachasị ji ụgwọ na Naịjirịa.

Ya mere ndị mmadụ ji eti mkpu n'elu soshal midia.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Akukọ ndị ga-amasị gị: