Nnamdi Kanu: "Ụjọ ndị agha ka na-atụ ụmụaka n'obodo a" - Ezinaụlọ na agbatobi ya

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: "Ụjọ ndị agha ka na-atụ ụmụaka n'obodo a" - Ezinaụlọ na agbatobi ya

Nwanne Nnamdi Kanu bụ Emmanuel na onye agbatobi ya bụ Samuel kọwara ujọ dị n'ahụ ụmụaka obodo ha bụ Afaraukwu maka ndị agha.

Ha kọwara na obi na-amapụ ụmụaka oge ọbụla aṅụrụ ụda ndị uweojii maọbụ ndị agha.

Emmanuel Kanu bụ nwanne Nnamdị Kanu kwuru na onweghị onyeisi ọzọ IPOB nwere na-abụghị nwanne ya nwoke.

Ọ gwara BBC na ozi ahụ pụtara na soshal midia kwuru na akwatuola Nnamdi Kanu dịka onyeisi IPOB bụ asị ọcha.

Kanu kwuru nke a mgbe onye ntaakụkọ BBC gara ịhụ etu ihe si kwụrụ na be ha.

Kanu

Ebe foto si, Chioma Obianinwa

Nkọwa foto, Nwanne Nnamdi Kanu kwuru na ọ ka bụ onyeisi otu IPOB

Mgbe BBC Igbo gagharịrị gburugburu ụlọelu ahụ Kanu na nna ya bụ Igwe ndị Afaraukwu bi, anyị hụrụ ọnụ egbe gbasasịrị ahụ aja ụlọ ahụ bụ nke e kwuru na ndị agha gbara.

Kanu
Nkọwa foto, Uzo e si aga be Nnamdi Kanu

Kanu boro gọọmentị na ndị agha Naịjirịa ebubo na Egwu Eke nke atọ bụ ka ha bịakwa laa ndụ ndị ejighi egbe ma ọ bụ mma n'iyi dịka ha mere n'Egwu Eke nke abụọ n'afọ gara aga.

Kanu
Nkọwa foto, Ndị ụka Nnamdi Kanu gbakọtara na-ekpere ya ekpere

Emmanuel Kanu kwuru na egbe niile ndị agha gbara n'isi ebe Nnamdi na-arahụ gosiri na ha bịara igbu ya egbu.

Kanu
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu kwuru na ọ bụ onye Jew

Ọtụtụ ndị otu Ipob gwara BBC na ihe nna ha ukwu bụ Nnamdi kwuru ka ha kwenyere na ya, wee kwuo na naanị referandum ga-egbo mkpa ndị IPOB.

Ndị otu ụka Kanu bụ ndị 'Judaism' zukọkwara n'uju n'ụlọ ya na-ekpe ekpere maka nlọghachite onyeisi ha.

Ha ekweghị ekwu okwu n'ihe onyonyo.

Kanu
Nkọwa foto, Otu ntupu mgbọ

N'agbanyeghị na ndị agha Naịjiria ekwuola na ha adịla njikere imalite "Egwu Eke nke atọ", ndị bi n'ogige ụlọ Kanu na-ebi ndụ ha dịka ha si ebi oge ọbụla.

Otu nwoke ụlọ ya chere ihu n'ụlọ Kanu, kwara ariri na ndị agha Naịjiria lara ọtụtụ ndụ ụmụ IPOB n'iyi oge ha mere "Egwu Eke nke abụọ" n'afọ gara aga.

O Kwuru na ọ chịzị obi n'aka n'ihi na ugbua Nnamdi kanu pụtara ihe ọzọ, onweghi onye ma ihe ga-eme ọzọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: