Uwazuruike akatọọla okwu Nnamdi Kanu
Uwazuruike akatọọla Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images
Onye ndu otu MASSOB bụ ralph Uwazuruike ekwuola na ogbo ya nke IPOB bụ Nnamdi Kanu anaghị achụso maka nwereonwe Biafra kama na ọ bụ nke onwe ya.
Uwazuruike gara n'ihu kwuo ka ndị mmadụ ghara ige ntị na mgbasa ozi Kanu nke sịrị ka ha emeela ntulika n'afọ 2019.
Ụlọikpe awụọla Fayose n'ala

Ebe foto si, Lere Olayinka
Onye bụbu Gọvanọ Ekiti Steeti bụ Ayodele Fayose ga-aga n'ihu ị nọ n'aka ụlọọrụ EFCC dịka ụlọikpe ukwu dị na Legọs ekweghi atọhapụ ya.
Ihe a bụ abalị ise Fayose nọ n'aka ndị EFCC n'ihi ebubo iri na otu banyere mpụ na nrụrụaka ego.
N'ofesi

Mba Saudi Arabia ekwetala n'eziokwu na egburu onye ntaakụkọ Jamal Khashoggi egbu nke butere oke ihe itimkpu na mba ụwa.
Minista mba ahụ na-ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Adel al-Jubeir kwupụtara nke a ma gọọ na aka onyeisiala ha adịghị n'ọnwụ nwa amadị ahụ.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Reuters
Onye nchịkọta otu Manchester United bụ Jose Mourinho agaghị anata ntaram ahụhụ maka ọgbaghara mere mgbe ha na Chelsea zutere n'izuụka gara aga.
Otu FA ekwuola na ha adọọla Mourinho aka na ntị banyere agwa ọkpara n'oge ọgbaaghara ahụ.
Nkeji n'abalị
Ihe nkiri nke taa
Nnamdi Kanu akpalitela mkparitaụka dị iche iche na social media

Ebe foto si, NNamdi Kanu/ Facebook
Ọtụtụ ndị mmadụ ka na-ekwu uche ha gbasara ozi Nnamdi Kanu zipụrụ na Facebook ụnyaahụ.
Social media na Naijiria nwurula ọkụ makana mkparịtaụka dị iche iche malitere ebe ụfọdụ ndị mmadụ kwetere n'ihe Kanu kwuru, nakwa ụfọdụ ekweteghị n'ihe o kwuru.
N'ime ozi ya, Kanu kwuru na IPOB ka na-alụ ọgụ inweta ala Biafra nakwa na agaghị enwe ezumike ma ọ bụrụ na Biafra apụtaghị dịka ala nwere onwe ha.
NLC na-enwe iwe ọkụ

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-ahazi ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ekwuola na ha ga-ebido abụbụ ọrụ n'ụbọchị isii n'ime ọnwa Novemba ma ọ bụrụ na gọọmentị emeghị ihe gosiri na ha ga-akwụ ha ụgwọ opekatampe ruru puku naira iri atọ.
Ha kwuru na abụbụ ọrụ a ga-abụ nke kachasị ukwu na Naịjirịa.
Mmadụ 30 emerụọla ahụ na Canada

Ebe foto si, EVN
Mmadụ ruru iri atọ na-eme mme mme na mahadum Clemson n'obodo California na mba Amerịka emerụọla ahụ oge ala ha kwụ ọtọ n'elu ya dakpuru n'ime.
Ndị gbatagbata kwuru na ọtụtụ mmadụ gbajiri ọkpụkpụ dị iche iche na ya bụ mberede.
Kimi Raikkonen emeriela Lewis Hamilton

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, Kimi Raikkonen emeriela onye ọkwọ ụgbọala bụ Lewis Hamilton, n'asọmpị US Grand Prix.
N'asọmpị Premier League, Arsenal na Leicester City ga-asụkọta isi n'elekere asatọ nke abalị taa.
Gee nkeji nke taa
Lee ihe nkiri nke taa












