NHIS: Gịnị mere Buhari ji ekpuchi Usman Yusuf?-PDP

N'etufughị oge, otu PDP akpokuola onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ kọwara ụmụ Naịjirịa ihe kpatara o ji ekpuchi odee akwụkwọ ụlọọrụ NHIS bụ ọkachamara Usman Yakubu,
onye ha kwuru na-ebola ọtụtụ ebubo nrụrụaka nakwa ego a sị ozuru ruru ijeri naira iri abụọ na ise.
Ha depụtara nke a n'akara twitter ha:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ndị uweojii ruru iri ise wakporo isi ụlọọrụ ndị National Health Insurance Scheme dịka ha dulatara onye odeakwụkwọ ha bụ Professor Usman Yusuf akwụsịrị ọrụ n'ime ụlọọrụ.
Ndị ntaakụkọ nọ mgbe ihe a mere kwuru na ndị uweojii gbara ndị ụlọọrụ NHIS anwụrụ anya mmiri ka ha ghara i gbochi ndụbata Yusuf.
Yusuf kwuru na ndị isi NHIS enweghi ikike ịkwụsị ya ọrụ.
Cheta na ndị isi ụlọọrụ NHIS kwụsịrị Yusuf ọrụ ruo oge a na-amaghị n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Oktoba.

Onyeisi ọgbakọ a kpebiri ị kwụsị Yusuf ọrụ bụ Yantu Ifene kwuru na ọ bụ maka nrụrụaka ego ruru nde narị naịra iri na itoolu.
Ka akwụsi chara ya ọrụ, onye odee akwukwọ a ṅụrụ iyi na ọ gaghị akwụsị ọrụ dịka ndị ọgbakọ sịrị kpebi e, na-ekwukwa na ọ bụ naanị onyeisiala nwereike iwepụ ya n'oche.
Ihe ọzọ ndị mmadụ na-ekwu maka akụkọ a n'elu soshal midia:
@iykkman kwuru na ihe a abụghị mbụ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Akụkọ ga-amasị gị:









