Akpọghachịla Usman Yusuf: Buhari nọ na nsogbu

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Red Media Africa

Nkọwa foto, A na ekwuzi na Buhari akwusighị ike na agha mpụ maka o dizi ka o na eme ima mmadụ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Okwu na-ewu taa bụ mkpọghachị onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari kpọghachịrị onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka mpaghara ahụike a na-akpọ NHIS bụ Usman Yusuf.

Okwu Yusuf Usman bu ihe entinyere anya maka na afọ gara aga, Minsta na ahu maka ahụike bụ Isaac Adewole nyere Yusuf ezumike ọrụ, ma hazikwa ndị nyocha ka ha tinye anya n'ọrụ Yusuf na-arụ na mpaghara ọ na-achị.

Akwukwọ o dere o jiri nye ezumike ike ruru Yusuf aka n'abalị isii n'ọnwa Jụlị 2017.

O kwesiri ịnọ ọnwa atọ na ezumike ahụ, mana ndị kọmitii na-ahụ maka ahụike na ụlọ ome iwu nke Naịjirịa nke nta tinyere ọnụ na okwu a, wee si ka akpọghachị Yusuf.

Onye no ni isi Komiti a bu Chike Okafor. Ha kpebiri n'aka Yusuf dị ọcha, ma sikwa na ọ mmegide ka Minista nke arụike na-emegide ya maka ọrụ ọ na arụ banyere etu ndị HMO (bụ ndị na ahazị etu e si akwụ ụgwọ maka arụike na Naịjirịa) si arụ ọrụ.

Okafor na Komiti ya kpebiri ka ewepụ nkwụsi ọrụ a enyere Yusuf nakwa ka-etinyere ha onye nchekwa.

Mana, ka aka nọ na-eche ka a mara ka Minista arụike ọ ga eme ihe Kọmiti a kwuru, ndị nyocha ọ haziri wepụtara nchọpụta ha, nke kpebiri na Yusuf mere mpụ n'ụlọ ọrụ ya.

Ndị nyocha si na aka Yusuf di n'ego ruru N919 nde bụ nke ojiri aghụghọ nweta.

Ha si na Yusuf mere ka ọ bụ ya "kachasị jide ọfọ, ma na azụ ha, o so na-amịkpọ NHIS".

Akara ntụ-ntụ

Maka Usman Yusuf

Yusuf Usman

Ebe foto si, NHIS

  • Yusuf si Amerịka ebe ọ na-arụ ka onye oka mmụcha dibia ụmụaka nata ịrụ ọrụ a
  • Ụlọọgwụ o na arụbụ ọrụ bụ St Jude Research Hospital di na Memphis, Tennessee
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Ahmadu Bello na Zaria
  • N'etiti 1984 na 1989 ,ọ nọ na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ nke mmụta nke mahadum Ahmadu Bello
  • O si ebe ahụ gawa Sout Carolina ebe o mechara bụrụ onye ọka mmuta n'ihe a na-akpọ Paediatric Hematology/Oncology n'afọ 1998
  • Onyeisiala Naịjirịa bu Muhammadụ Buhari mere ya onyeisi NHIS n'afọ 2017.
Akara ntụ-ntụ

Onye na ekwuchitere onyeisiala Naịjirịa bụ Femi Adesina gwara BBC Igbo na ya amaghị maka mpọghachịa emere Yusuf, ma kwuo na ọ minista ahụike ga-aza aziza dị n'ime ya.

BBC Igbo gbara mbọ inwete Minista arụike ka o kwuo ụche ya gbasara okwu a, mana ekwenti ya gbaṅụrụ agbaṅụ.

Kedu ka esi ahụzi aghaa na-ebuso mpụ?

Ka akụkọ mpọghachị a emere Yusuf putara ihe, ndị mmadụ na Twita na Facebụk bidoro ikwụpụta iwe ha banyere ya.

Ọtụtụ mmadụ na ekwu na ihea Buhari mere gosiri n'onweghị mgbe o ji chụọ ibuso mpụ na aghụghọ agha etu o si na-ekwu.

Ụfọdụ ndị ọzọ na ekwu na ya bu mkpọghachị gbara ama ụdị mmadụ Buharị bụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Skip X post, 3

End of X post, 3

Skip X post, 4

End of X post, 4

Skip Facebook post, 1

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 1

Mana, onwekwere ndị kwenyere na ihe a Buharị mere, na akọwa na NHIS na-ada ada.

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2