Nnamdi Kanu: 'Anyị ga-ekwu uche anyị' - Lai Mohammed

Lai Mohammed bụ Minista na-ahụ maka mgbasa ozi gwara BBC Igbo n'ekwentị na ha ahụla ihe onyonyo Kanu
O kwuru na ha dị nkwadobe ugbua ịzi ozi gbasara ya bụ ihe onyonyo nakwa Nnamdi Kanu n'onwe ya.
Cheta na Kanu furu efu kemgbe awakporo ụlọ nna ya n'atụmatụ "egwu eke" n'ụbọchị 14 nke Sepụtemba afọ 2017.
Kemgbe a hụchara ihe nkiri gosiri na onyeisi ndị otu Indigineous people of Biafra dị ndụ, ndị mmadụ kpụ okwu Nnamdi Kanu n'ọnụ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
Onye ọkaịwụ ukwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor kwuru na ọ bụrụ ya ihe ọṅụ mgbe ọ nụrụ onu Nnamdi Kanu n'ekwenti.
O kwukwara na oge na-adịghị anya, na Nnamdi Kanu ga-ekwu okwu n'igwe mgbasa ozi ka ụwa niile nụrụ olu ya ma mara arụ niile mere ụbọchị ndị agha Naịjirịa wakporo
Ejiofor kwuru na ndị agha Naịjịrịa ga-agwa ụlọikpe ihe mere ha ji gbuo ihe ruru mmadụ iri na ise ụbọchị September 14, 2017 ha wakporo ụlọ nna Nnamdi Kanu.
Mgbe BBC Igbo kpọrọ n'ekwenti ndị agha Naịjirịa ka ha nụrụ ihe ha nwere ike ikwu maka mpụta Nnamdi Kanu, ọnụ na-ekwuchitere ndị agha Naịjirịa bụ Texas Chukwu ebughị ekwenti nke o ji a azaghachị ozi ezigara ya n'ekwenti.
Onụ na-ekwuchitere ndị IPOB ọnụ bụ Emma Powerful kwetere na ha ahụla Nnamdi Kanu ebe ọ na-ekpe ekpere na isi-aja Jerusalem.
Powerful kwuru na obi bụ sọ ndị otu IPOB anụrị makana onyeisiaha dị ndụ.
Ihe a na-ekwu n'elu soshal midia
OgbeniDipo kwuru na ọgbagojuru anya na ndị agha Naịjirịa egbughị Nnamdi Kanu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
WendyPrincea kwuru na onwere ihe di omimi so mpụta Nnmadi ugbua. ọ na-ayọkwa ka ndị Igbo leghara ya anya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
MilkyJohny kwuru na ọ bụ ihe nnukwu ọṅụ na Nnamdi Kanu ka adị ndụ, nke a gosiri na Biafra a dila nso.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Onye ndụ otu IPOB na mba Briten agwaala BBC Igbo n'ekwentị na Nnamdi Kanu dị ndụ.
O kwuru na ihe onyonyo ahụ bụ nke ezi ya nakwa na Kanu n'onwe ya na-akwado ị gaa mba ofesi ebe ọ ga-anọ gwa ụwa niile okwu.
Akụkọ pụtara n'oge gara aga na Nnamdi Kanu nke ahụbeghị kemgbe emere "egwu eke" na be ya apụtala n'ọha ugbua.
N'ihe onyonyo na-efeghari na soshal midia, o gosiri ebe Nnamdị Kanu na-ekpe ekepere na Jerusalem.
Onye ndụ otu IYM bụ Elliot Ugochukwu Ukoh gwakwara BBC Igbo n'ekwentị na ihe onyonyo ahụ bụ nke ezi ya.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
Onye zitere ihe onyonyo a bụ Paul Achalla gwara BBC Igbo na Kanu ga-esi mba Jerusalem gaa mba Uk ụbọchị ụka na-abịa.
BBC Igbo amaghị ka ihe onyonyo a ọ bụ ezie mana a na-elebakwa anya n'ihe gbasara ya.
Cheta na mgbe BBC Igbo gbara nwunye ya bụ Uchechi Kanu ajụjụ, o kwuru na ọhụ beghị di ya kemgbe emere "egwu eke"
Akụkọ ga-amasị gị











