Ntuliaka 2019: Ụmụnwaanyị omeiwu kwuru na ha chọrọ oche osote onyeisiala na 2019

Ebe foto si, @Aso Rock/ Twitter
Ụmụnwaanyị omeiwu gara hụụ onyeisiala Muhammadu Buhari n'Asọ Rọk, Abuja ụbọchị Fraide ịrịọ ya ka o nye ụmụnwaanyị ọkwa osote onyeisiala n'afọ 2019.
Ụmụnwaanyị mere njem ahụ gunyere ụmụnwaanyị niile a họpụtara site na steeti 36 niile dị na Naịjirịa.
Onye kwuchitere ha ọnụ ha bụ Elizabeth Ativie kwuru na ụmụnwoke na-ekewapụ ụmụnwaanyị na Naịjiria.

Ebe foto si, Aso Rock/ Twitter
O kwuru na ọ bụ naanị otu mgbe ka ụlọomeiwu nke ukwu na nke nta nwere nwaanyị welitere isi n'ọkwa kemgbe ebidoro ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjiria n'afọ 1999.
O gwakwara onyeisiala na ihe ọbụla ọ gwara ha n'ọgbakọ ahụ "ga-abụ atụmatụ ga-emechaa bụrụ iwu."
Maka nke a, o kwuru na "oge ọbụla onyeisiala bụ nwoke, osote ya kwesiri ịbụ nwaanyị."
Nwaanyị Ativie kwukwara na n'ime nkewapụta atọ e ji anọchite anya na sineti, otu n'ime onye nnọchite anya kwesiri ịbụ nwaanyị ebe e nwekwara mmadụ itoolu ndị nnọchiteanya n'ụlọomeiwu nta, mmadụ isii kwesiri ịbụ ụmụnwoke ebe mmadụ atọ ga-abụ ụmụnwaanyị.
Na nzaghachi, onyeisiala Muhammadu Buhari jiri ọchị gwa ha "na osote onyeisiala anọghị ebe a mana ebumnuche na onye odeeakwụkwọ ga-agwa ya na a chọrọ ịnara ya ọrụ ya."
Mana o kelere ụmụnwaanyị ahụ maka nkwado ha na ụmụnwaanyị ndị ọzọ kwadoro ya ugbo anọ niile ọ zọrọ ọchịchị.
Maka ihe ha rịrọrọ ya, onyeisiala gwara ha na ya "adịghị ike etu ha chere" na onye nwereike ime ụdị ihe ahụ bụ onye na-achịụ n'oge ndị amị mana ya edosela akwa amị ya yiri "agbada".
Onyeisiala Buhari ga-azọ ọchịchị ọzọ dịka n'afọ 2019.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










