'Ndị ọchị ehi' Egbuola ndịagha Naịjirịa abụọ na Plateau

Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndịagha Naịjirịa na ọrụ nchekwa na Plateau, Benue na Steeti ndi ọzọ

Akụkọ si Plateau Steetị apụta na-akọwa na ndị a na-eche na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi gburu ndị agha Naịjirịa abụọ so na "Operation Safe Haven" (OPSH) mgbe ha na ndị nchekwa obodo nkịtị bara ọgụ n'obodo Dong dị n'ụsọ okpuru ọchịchị ime obodo Bassa na Jos Saụt dị na steeti ahụ.

Onye na ekwuchịtere OPSH bụ Majọ Umar Adams kwenyere na ndị agha nwụrụ, ma kwuo na ndị agha abụọ ọzọ merụrụ ahụ n'ọgụ ahụ. O kwukwara na ha nwụchịkọrọ mmadụ asaa maka ogbugbu mmadụ a.

Majọ Adams na-akọwa na ọgụ a sitere n'ogbugbu mmadu 25 bu ndị Irigwe bu ihe a na-ebo ndi a na-eche na ha bu ndị Fulani na-achi ehi n'abali Monde.

O kwukwara na ha wolitere aka maka nchekwa obodo ebe ọgbaghara a metụtara ịhụ na ogbugbu mmadụ a kwụsịrị.

"Ndị nchekwa obodo nkitị na ndi Fulani na-achi ehi nụru ọgụ n'ụtụtụ Wenesde na gbụrugbụru obodo Miango. Egbụrụ ndị agha abụọ ma merụọ abuọ ọzọ ahụ ka ogbaghara na-eme.

"Anyị nwuchịkọrọ mmadu asaa ma hazigharia ọru nchekwa n'ebe ihe a mere," Adams gwara ndị ntaakuko.

Ndi ntaakụkọ kwụrụ na ndị nchekwa nkịtị 12 merụru ahụ n'ọgụ a ma nọkwara n'ụlọọgwụ na-anata ọgwụgwọ ugbua.

Ogbugbu mmadụ a na-ebo ndị Fulani na-achị ehi bụzị ezigbote nsogbu na Naịjirịa bu ebe ọtụtụ mmadu na ekwu na gọọmentị Muhammadụ Buhari adịghị eme ihe kwesiri ka-ahu na ọgbaghara ndị kwụsiri. Mana, Buhari si na ya na-eme ike ya ka ahu na echekwara obodo niile nke ọma.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ