Teodorin Nguema Obiang: Oringo atọwa ya isi

Ebe foto si, AFP
Gọọmentị mba Switzerland amalitela ire ọtụtụ ụgbọala ha natara n'aka Teodorin Nguema Obiang bụ nwa onyeisiala mba Equatorial Guinea.
A natara ụgbọala ndị ahụ n'aka Obiang dịka e mechara ya nnyocha maka nrụrụaka.
Ụgbọala ndị ahụ bụcha ụgbọala ndị dara oke ọnụahịa dịka 'Lamborghini, Ferrari, Bentley nakwa Rolls Royces'.

Ebe foto si, Reuters
Ihe ruru ụgbọala 25 nke ndị ọrụ nchekwa sị na a natara Teodorin ka a ga-ere n'obodo a kpọrọ Cheserex na mba Switzerland.
Ego e retere n'ụgbọala ndị ahụ ga-agara ndị ụwa na-atụ n'ọnụ na mba Equatorial Guinea.

Ebe foto si, Reuters
Nna Nguema bụ Teodoro Nguema Obiang achịala Equatorial Guinea ihe ruru afọ iri anọ.
Nwa ya bụ Teodorin gbara afọ 51 bụbu mịnịsta na-ahụ maka ọrụ ubi.

Ebe foto si, Reuters
Mana n'afọ 2012, nna ya họọrọ ya dịka osote onyeisiala.
Ihe e ji mara Teodorin Nguema Obiang bụ ịgba oringo nakwa ikpori ndụ dịka akwụkwọ akụkọ 'New York Times' si depụta n'afọ 2004.

Ebe foto si, AFP
Gọọmentị Swizaland malitere inyocha ya maka nrụrụaka na imebi akụnụba obodo.
Mana e mechara kwụsị ya bụ Nnyocha.

Ebe foto si, Getty Images
N'afọ 2017, mba Fransị mara Teodorin ikpe maka nrụrụaka ma tụọ ya nga afọ atọ nke Bekee kpọrọ 'suspended jail term'.
Equatorial Guinea so na mba dakarịrị ogbenye n'ụwa.

Akụkọ ndị ọzọ ga-anasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










