Illegal maternity centres: Ndị uweojii azọpụtala ụmụnwanyị 19 e ji eji n'ụlọ nzuzo ebe a na-ere ụmụaka

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ dị mkpa:

Onye dị ime

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii na Legọs Steeti azọpụtala ụmụnwanyị iri na itoolu bụ ndị e ji eji n'ime ụlọ nzuzo ebe a na-ere ma na-azụkwa ụmụaka a mụrụ ọhụrụ.

Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV si deputa, ụlọ nzuzo ahụ dị na mpaghara Ikotun nke dị na Legọs.

Ụmụnwanyị iri na itoolu ahụ azọpụtara dịcha ime.

Onye kacha dị nta n'ime ha gbara afọ iri na atọ (13) ebe onye kacha bụrụ okenye dị afọ iri abụọ na asatọ (28).

Ndị uweojii zọpụtakwara otu nwa ọhụrụ a mụrụ naanị otu ụbọchi gara aga.

Ha nwụchikwara ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ na ya bụ ụlọ nzuzo.

Mana onye nwe ya bụ ụlọ aha ya bụ 'Madam Oluchi' bu onye ndị uweojii sị na a ka na-achọ achọ ugbua.

Stanley Nwabia alaala mmụọ

Stanley Nwabia.

Ebe foto si, Facebook/Stanley Nwabia

Oke ọdachi dakwasara Igbo taa. Ọnwu egbujọọla ọzọ

Nwaafọ Igbo a ma ama n'ọbaozi Twitter bụ Stanley Nwabia alaala mmụọ.

Nwabịa gbara afọ iri anọ na atọ.

Ọ nwụrụ n'ụtụtụ Sọnde n'ụlọgwụ dị na Legọs.

Ọnwụ ya bịara ndị mmadụ na mberede n'ihi na abalị atọ gara aga ka o si n'akara 'Twitter' ya zipu ozi.

Ọtụtụ ndị nwere agba na Naịjirịa dịka Atiku Abụbakar nakwa otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' kwuru na ọnwụ Stanley wutere ha.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Nne Siasia enwerela onwe ya

Nne Samson Siasia bụ Ogere Beauty Siasia

Ebe foto si, ONYINMIEBI SIASIA

Nkọwa foto, N'ụbọchị ole na ole gara aga, Siasia nọ na-arịọ ka ndị ntọrị a hapụ nne ya.

Ndị ntọrị atọhapụla nne Samson Siasia onye bụbu onye nchịkọta otu Super Eagles dịka ọ nọchara ihe karịrị ọnwa abụọ n'aka ha.

Ekwerikumo Siasia bụ onye ezinaụlọ ha gwara BBC na ndị a tọhapụrụ nwaada Ogere Beauty Siasia n'ime abalị Satọde 28 Seputemba, 2019.

Ọ sị na ha tọhapụrụ ụmụnwaanyị abụọ ndị ọzọ a tọọrọ ya na ha.

Samson Siasia bụbu onye ntuziaka ndị Super Eagles

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nke a bụ nke ugboro abụọ a na-atọrọ nne Siasia, nke mbụ bụ n'afọ 2015.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Bayelsa Steeti bụ Butswat Asimin sị na nke a bụ eziokwu, na ha na-aga n'ụlọ ha ị mata ka 'eke si anya anwụ'.

Cheta na ndị ntọrị tọọrọ nne Siasia n'ụbọchị 15 Julaị, 2019 n'obodo ha bụ Odoni, okpuruọchịchị Sagbama dị na Bayelsa Steeti.

Ọgwụ obi nwere ibute ọrịa kansa

Ọgwụ na-akwụsị obi ịcha ọkụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọgwụ na-akwụsị obi ịcha ọkụ

Ụlọọrụ na-ere ọgwụ akpọrọ CVS dị na Amerika esorola ndị ọzọ machiri ire ọgwụ achaobi nke Bekee kpọrọ 'Heartburn'.

A na-atụ egwụ na ọgwụ a nwere ike ibute ọrịa kansa.

Mba Canada na Fransị amaala ọkwa ka ndị niile goro ya bụ ọgwụ weghachite ya azụ.

Buhari agbarụọla ihe na njide ụmụnwoke na Kaduna

Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa kwuru na ọ bụ arụ ka nne na nna gbajọọ itinye nwa ha n'ụlọakwụkwọ n'oge a

Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla njide na mmekpa ahụ e mere ụmụaka na ụmụnwoke ruru narị ise n'otu ụlọ dị na Rigasa, Kaduna Steeti.

N'ozi si n'aka onye enyemaka ya na mgbasaozi bụ Garba Shehu pụta, Buhari sị na a kọwara ụlọ ahụ dịka ebe ịtụ mgbere mmadụ.

Onyeisiala jikwa ohere a kwuo na ụmụaka niile nọ ebe ọbụla kwesiri inwe ezi nchekwa ka ha ghara idabanye n'ihe ọjọ ọbụka na-ame n'obodo ebe ha nọ.

N'okwu ya, " Ọ bụ nnukwu arụ ka ndị nne na nna ọbụla gbajọọ ikpọga nwa ya ụlọakwụkwọ n'oge a."

Cheta na ndị uweojii zọpụtara mmadụ ruru narị atọ gụnyere ụmụnwoke na ụmụaka n'ụlọ ebe ekere ha agbụ kamgbe ọnwa iri atọ na Kaduna.

Ikpochapụ unyi n'Abia na Imo Steeti

Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015

Ebe foto si, @okezieikpeazu

Nkọwa foto, Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015

Iji mee ka oke unyi dị n'Abia Steeti kwụsị gọvanọ Okezie Ikpeazụ enyela onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mkpofu unyi bụ Okechukwu Apugo ọsọ.

N'otu aka ahụ gọọmentị Imo steeti amachiela ndị mmadụ iji akpa wakịrị wakịrị ekpofu unyi na Steeti ahụ.

N'ofesi

Ụlọ mkpori ndụ bụ La Feria Chapultepec

Ebe foto si, Reuters

Ihe ruru mmadụ abụọ anwụọla ebe mmadụ abụọ ọzọ merụrụ ahụ dịka igwe na-agba okirikiri bụ roller coaster na bekee kwọpụrụ n'okporo ya n'obodo Mezico.

Anya hụrụ ka o si mee kwuru na ndị a si n'elu elu igwe ahụ dị n'ama mkpori ndụ La Feria Chapultepec daa.

N'egwuregwu

Coleman eturula ugo

Christian Coleman

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Christian Coleman

Christian Coleman nke mba Amerịka eturula ugo na asọmpị igba ọsọ nke mita narị n'egwuregwu World Athletics Championship nke na-aga n'ihu ugbua n'obodo Doha, Qatar.

Naanị tịnkọm tịnkọm itoolu na ụma asaa ka o were Coleman iji nweta mmeri a.

Justin Gatlin bụkwa onye Amerịka gbara onye nke abụọ na ya bụ asọmpi.

Andre De Grasse onye Kanada gbara onye nke atọ.

Everton na Manchester City

Ebe foto si, Getty Images

N'asọmpi Premier Manchester City ji ọkpụ atọ asatara otu merie Everton iji na-ahụ azụ Liverpool anya.

Ebe Atletico Madrid na Real Madrid enweghi onye meriri ibe n'asọmpi nke La Liga.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasị gị

Aha onyonyo, Igbo Culture: Usoro e ji echi nze n'ala Igbo

Akụkọ ndị ga-amasị gị