Akwamozu Ekwueme: Ndị isi ala ochie na gọvanọ di iche iche agbakọla

Ebe ile anya ikpeazụ.
Nkọwa foto, Ekwueme so na ndị mere ka ọchichi onye kwuo uche ya laghachite n'ala Naijiria

Ndị mmadụ karịrị puku ise gbakọtara n'Ọkpara square dị n'Enugwu taa ịsị Alex ekwueme laa mmụọ ya n'udo.

Mmemme ahụ jiri Ika ụka wee bido. Onye isi nchụ aja na ya bụ ụka ọnwụ bụ nnukwu ukọchukwu ndi Anglican bu bishop Emmanuel chukwuma gwara ndị gbakọrọ n'emume a ka ha ṅyomie ezigbo ndụ

Ekwueme biri mgbe ọ nọ ndụ.

Aha onyonyo, Bishop Chukwuma na dụ ndị biara emume a ọdụ

Ekwueme nwụrụ n'ụlọọgwụ dị na London na Dicemba 2017.

Ndi gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ jikọrọ ọnụ biakwa na ya bu okpara square kwanyere Alex Ekwueme ugwu.

Ndi biara bu gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nke Enugu, Dave umahi, Ebonyi, okezie ikpeazu Abia, ebe osote gọvanọ Imo bu eze Mmadụmere nọchitere anya gọvanọ Rochas Okorocha.

Ozokwa osote gọvanọ Anambra bụ Nkem Okeke nọchitere anya Willie Obianọ.

Osote gọvanọ ndị Anambra steetị
Nkọwa foto, Ndị ọbịa biara emụme a kwuru ọtụtụ okwuọma gbasara Ekwueme.
Eze Mmadụmere
Nkọwa foto, Osote govanọ ndị Imo steetị Eze Mmadụmere

Nwanne ya bụ Laz ekwueme bụ onye ọkanmụta duru ndị ukwe buọ ukwe Halleluia nke oji si nwanne ya jee n'udo.

Akara ntụ-ntụ

Ụfọdụ ihe dimkpa kwesiri ima maka Alex Ekweme

  • Alex bụ Dókinta ji asambodo di iche iche tupu ọnwuọ
  • Ọ bụ osote onye isi ala Naijiria eji mbinye aka n'akwukwọ họputa
  • O so na ndị mere ka ọchichi onyekwuoucheya laghachite n'ala Naijiria
  • O keputara mpaghara ọchịchị isii na Naijiria a kpọrọ Geo-political zones
  • Ọ bụ ya hibere pati a na-akpọ PDP na Naijịrịa.
Akara ntụ-ntụ