Anambra Erosion: 'Mbuze na-abọpụtazị ozu eliri na Nnewi'

Aha onyonyo, Mbuze na-abọpụtazi ozu n'Anambra

Mbuze bụ ihe na echere ndị Uruagu Nnewi, Anambra Steeti aka mgba eriela ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ n'ihi na enweghị etu esi echekwa ya bụ mberede ka mgbe ihe karịrị afọ iri na atọ ọmalitere.

Ebe mbuze ahụ na-akpa ya bụ mkpamkpa bụ na 100 foot Road, nke na izu uka gara aga mbuze ahụ eriela ụlọ elu abụọ ọzọ ma kewapụ streeti Bank Road na 100 foot Road Nnewi.

Mazi Ugochukwu Ndefo, onye Uruagu Nnewi kọwara na ya bụ mbuze malitere ịkpa ike ihe dịka afọ iri atọ gara aga.

Mbuze

Ebe foto si, BBCIgbo

Nkọwa foto, Mbuze na-agba ndị Uruagu aka mgba

Ndefo kọwara na ka mgbe ya bụ nwatakịrị na ya bụ mbuze eriela ụlọ oriri na ọṅụṅụ Ekene Dili Chukwu nwe, rie ụlọ akwụkwọ nakwa ụlọ na ngwa ahịa ndị mmadụ dị ọtụtụ.

Mbuze Uruagu

Ebe foto si, BBCIgbo

Nkọwa foto, Ndị bi n'ụzọ 100 Foot na-akọwa na otela ezigbote aka Mbuze a malitere

Mbuze bọpụtala ozu eliri

Mazi Ifeanyi Nnama kọwara na ụlọ mbụ ya biri na 100 Foot Road Nnewi abụrụla nke mbuze loro kpamkpam.

Ọtụtụ ndị bị na ya bụ ebe kọwara na izu ụka abụọ gara aga na mbuze ahụ bọpụtara ozu otu nwoke eliri n' ala ya, nke mere na ndị nwe ya bịara buru ozu ya gaa lie ebe ọzọ.

Ka ọ dị ugbua ụzọ sị 100 Foot Road na Nnewi were gaa bank road abrụla nke mbuze kewara abụọ.

Ndị niile bị n'ụlọ dị nso na ya bụ mbuze agbaala ọsọ ndụ n'ihi ma ha amaghị mgbe mbuze ahụ ka abịa ọzọ.

Mbuze

Ebe foto si, BBCIgbo

Nkọwa foto, Ụzọ 100 Foot n'Uruagu bụzị ebe ndi bi na ya chi obi ha n'aka maka mkpa mkpa mbuze
Mbuze

Ebe foto si, BBCIgbo

Mbuze Uruagu
Nkọwa foto, Ọtụtụ ụlọ adanyela n'ime Mbuze a. Ụfọdụ no n'ụzọ ịda
Mbuze

Ebe foto si, BBCIgbo

Nkọwa foto, Ndị ụlọ ha nọ n'ọnụ Mbuze a akwapụla
Mbuze Uruagu
Nkọwa foto, A na-awụnye dọtị n'ime mbuze a
Mbuze Uruagu
Nkọwa foto, Mbuze a etiwala ụzọ 100 Foot abụọ
Mbuze Uruagu
Nkọwa foto, Akụkọ bụ na ihe niile emere maka mbuze arụghị ọrụ
Mbuze

Ebe foto si, BBCIgbo

Nkọwa foto, Ọtụtụ ụlọ ọrụ na ụlọ ndi mmadu nọ n'okporoụzọ '100 foot'
Akara ntụ-ntụ

Lekwa mkpa mkpa ndi ọzọ mbuze na-akpa n'Anambara

Aha onyonyo, Oraifite: 'Mbuze a anapụla a m ihe niile m ji bụrụ mmadụ'
Aha onyonyo, Mbuze achụpụla ndị mmadụ n’ụlọ ha na Nanka