Buhari: Ihe ndigbo chọrọ ịgwa onyeisiala ma ha zute ya

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Twitter/APC Nigeria

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Nyocha BBC Igbo mere ndị na-eso ha na Facebook gosiri na ụfọdụ ndị Igbo achọghị iji ntị anụ maka onyeisiala Muhammadu Buhari.

Ọtụtụ n'ime ha kwuru na ihe ga-aka eme ha obi aṅụrị bụ ma Buhari gbanwee ọchịchọ obi ya bụ ịchị Naịjirịa ọzọ bido n'afọ 2019, laa ezumike nka.

BBC Igbo jụrụ sị "Ọbụrụ na ị nwere ohere ịgwa Buhari otu ihe, gịnị ka ị ga-agwa ya?" ihe karịrị mmadụ 100 tinyere ọnụ n'okwu ahụ na Facebook.

Ihe ha kwuru

1) Ndị chọrọ ka ọ rụọ ọrụ:

Humble Stonecoated Roof chọrọ ka ọ rụọ ihe ndị e kwesịrị ịrụ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ.

Humble Stonecoated Roof chọrọ ka Buhari tinye anya n'ịrụ ihe ndị dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ

George Onyebuchi kwuru sị "M nwee ohere ịgwa ya okwu, m ga-agwa ya ka o lerutu anya n'ụzọ dịgasị n'ala Igbo. Ụzọ dị na South East ekwerọzị ọgịga.

Ndị ọrụ ya niile bụ naanị ndị Awụsa, ka o lerutu anya na "federal character" ma ọ na-ewe ndị ọrụ ya."

Goodness Ezeh kwuru sị "Ihe m ga-agwa ya bụ, ka O jiri ike ya dịka onyeisi ọchịchị ala anyị, rụọ ọrụ ka ụkọ nri, ihe isiike, nakwa ogbugbu a na-egbu ọtụtụ ndị mmadụ n'akụkụ dị icheiche n'ala anyị kwụsị, onye ọbụla aka ya dị n'igbu mmadụ ibe ya, ka a kpụpụ ya ụlọikpe."

2) Ndị chọrọ ka o zuo ike:

Otu onye bụ Felix Ejeagba, kwuru sị na ọ ga-agwa Buhari ka ọ gaa zuo ike.

Ihe Felix Ejeagba kwuru

Azubuike Chijioke kwuru sị "Ihe m ga-agwa ya bụ na ọ ga-ahapụ ọchịchị nke ugboro abụọ ya, ka ndị ọzọ chịa."

Marc Riz Powertools kwuru sị "Otu ihe m ga-agwa ya bụ ya rituo n'oche prezidenti."

3) Ndị chọrọ ịjụ maka asambodo ya:

Yugo Ahaiwe sị na ọ ga-ajụ ya ihe gbasara asambodo ule WAEC ya.

Yugo Ahaiwe ga-ajụ maka asambodo Waec ya

Onye ọzọ chọrọ ịma maka asambodo ya bụ Emeka Ezejah kwuru sị "M ga-ajụ ya etu esi meere ya asambodo ọhụrụ ebe o kwuru na nke ochie ya nwere dị n'ebe ndị agha obodo anyị nọ, ka ọ bụ na o kwuchara sị na ya ekwurọzị?

Ndukaku De Chemist sịkwa na ọ ga-ajụ ya "Kedụ otu ị si dee ule WASC n'afọ 1961 ma weta akara n'afọ 2018, ma foto ya egosighi afọ ole ọ dị na 1961?

4) Ndị chọrọ ka o nye ha Biafra:

Onyia Fabian Nnamdi kwuru sị ka Buhari nye ndị chọrọ Biafra nnwereonwe.

Onyia Fabian Nnamdi chọrọ ka Buhari nye ndigbo Biafra

Stephen Okike kwuru sị "Agam agwa ya ka ọ hapụ Biafra ka ha nwere onwe ya."

Gụọ ihe ndị ọzọ kwuru na soshal midia ebe a:

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ