Enugu Airport Closure: Lee etụ ị ga-esi hazigharia njem gị tupu a gbapee ọdọụgbọelu Enugu

Akanu-Ibiam Airport Enugwu

Mmechi e mechiri otu ọdọ ụgbọelu eji aga mba ụwa dị n'ọwụwa anyanwụ bụ ọdọ ogbuelu Akanụ Ibiam dị n'Enugwu a bụghịzi akụkọ eji nwayọ ekwu.

Ihe gọọmentị etiti kwuru na ọ bụ kpatara mmechi a bụ ka ha nwee ike rụọ ya ọrụ ka njem ndị mmadụ na-adị mfe.

Mmechi a abụrụla ihe oke echiche nye ndị njem ebe ọdọụgbọelu ndị ọzọ ha nwereike iji dị ezigbo anya dịka nke Owerri, Port Harcourt na Asaba.

Gụnyekwara na okporo ụzọ e si aga ebe ndị a adịchaghị mma nakwa ndị omekaome juru n'ụzọ.

Aha onyonyo, Etu ụzọ si Enugwu gawa Owerre dị n'ụfọdụ ebe

N'ime akụkọ a BBC Igbo nyere ntuziaka etu onye njem si n'Enugwu ga-esi aga n'ọdọ ụgbọelu ndị ọzọ ahụ.

Nke bụ onye si ọdọ ugbọelu ndi ọzọ na Naịjirịa aga Igbo o mara nke ga-akarị ya mfe.

Ngwa, lezia ka o si kwụrụ:

Ọdọ ụgbọelu nke Enugwu
Nkọwa foto, A ka na-arụ ọrụ n'ọdọ ụgbọelu nke Enugwu

Ọdọụgbọelu Sam Mbakwe dị n'Owerri:

Onye ọbụla si ọdọụgbọelu Sam Mbakwe na-aga Enugwu ma ọ bụ si Enugwu na-aga ọdọ ụgbọelu a ga-agba okporoụzọ ndị gụnyere;

  • Enugwu - Okigwe - Owerri: Okporoụzọ a dị kilomita 145, ọ ga-ewe ihe dịka awa abụọ na nkeji iri ise na ise (2h 55min).
  • Enugwu - Okigwe - Orlu - Owerri: Okporoụzọ a dị kilomita 167, ọ ga-ewe ihe dịka awa abụọ nkeji iri ise na asaa (2h 57min).
  • Enugwu - Okigwe - Umuahia - Umuịkaa - Owerri: Okporoụzọ a dị kilomita 202, ọ ga-ewe awa atọ na nkeji iri abụọ (3h 20min).
Okporoụzọ ndị si Enugwu gawa Owerri

Ebe foto si, Google Map

Ọdọụgbọelu Port Harcourt:

Ọdọ ụgbọelu a bụ nke esikwa mba ofesi efelata maọbụ fegaa.

Onye ọbụla si ọdọụgbọelu Port Harcourt na-aga Enugwu ma ọ bụ si Enugwu na-aga ọdọ ụgbọelu Port Harcourt ga-agba okporoụzọ ndị gụnyere;

  • Enugwu - Okigwe - Owerri - Umuechem - Port Harcourt: Nke a dị kilomita 238, ọ ga-ewe awa anọ na nkeji iri ise (4h 50min).
  • Enugwu - Okigwe - Owerri - Umuakpụ - Port Harcourt: Ọ dị kilomita 237, ọ ga-ewe awa anọ na nkeji iri na anọ (4h 14min).
  • Enugwu - Okigwe - Umuahia - Okpuala - Chokocho - Port Harcourt: Ọ dị kilomita 239, ọ ga-ewe awa anọ na nkeji abụọ (4h 2min).
Okporoụzọ ndị si Enugwu gawa Portharcourt

Ebe foto si, Google Maps

Ọdọụgbọelu Asaba dị na Delta Steeti:

Onye ọbụla si ọdọụgbọelu Asaba na-aga Enugwu ma ọ bụ si Enugwu na-aga ọdọụgbọelu Asa ga-agba okporoụzọ ndị gụnyere;

  • Enugwu - Abia - Awka - Onitsha - Asaba: Ọ dị kilomita 129, ọ ga-ewe awa abụọ na nkeji iri ise na abụọ (2h 52min).
  • Enugwu - Abia - Awka - Ogidi - Onitsha - Asaba: Ọ dị kilomita 137, ọ ga-ewe awa atọ na nkeji ise (3h 5min).
  • Enugwu - Agwu - Umuchu - Nnewi - Onitsha - Asaba: Ọ dị kilomita 183, ọ ga-ewe awa atọ na nkeji iri atọ na otu (3h 31min).
Okporoụzọ ndị si Enugwu gawa Asaba

Ebe foto si, Google Map

Kedụ ka ọnọdụ nchekwa okporo ụzọ ndị dị?

Na nso nso ọtụtụ okporoụzọ ndị dị n'ọwụwa anyanwụ nwere nsogbu nchekwa n'ihi oke ohi na ntọrị ndị mmadu site n'aka ndị omekaome.

Nke a mere ndị mmadụ na-achị obi ha n'aka oge ọbụla ha na-agba n'ụzọ ndị a ka ọfọdụzie ugbu e mechiri ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.

Mana gọvanọ Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi na ogbo ya nke Ebonyi Steeti bụ David Umahi ekwela nkwa ihiwe nchekwa nye njem si na Steeti dị iche iche.

N'okpro ụzọ dị gasi n'Enugwu, gọọmentị na-asụmị ọhịa iji gbochie ebe ndị omekome na-anọ.

N'otu aka ahụ, e hiwela ogige ndịagha ruru anọ n'okporoụzọ si Enugwu gawa Okigwe nakwa ndị uweojii n'okporoụzọ ndị ọzọ.

Dịka ọ dị ugbua amabeghi mgbe a ga-arụcha ọrụ n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam nke Enugwu.

Etụ ị ga-esi hazie njem gị

Nyocha njem gị, mata ọdọ ụgbọelu nke ga-akara gị mma, ijee mata ụgbọelu nke na-aga ebe ahu, kwụọ ụgbọ n'oge were malite.

Mana, matakwa na onweghi ụzọ ọbụla esi aga ihe dịka Enugwu na Ebonyi site ọdọ ụgbọelu ndị a dị ka o siri kwesi.

Ije ọma

Akara ntụ-ntụ
Aha onyonyo, Okporoụzọ ala Igbo