Enugu Airport Closure: Amapụtala m ijeri naịra 10 maka ịrụzi ọdọụgbọelu Enugwu - Buhari

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ dị mkpa

Amapụtala ijeri naịra 10 maka ịrụzi ọdọụgbọelu Enugwu - Buhari

Akanu Ibiam Airport

Onyeisiala Muhammadu ekwuola na ọmapụtala ego dị ijeri naịra iri maka ịrụzi ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.

O kwuru na o mere nke na-agbanyeghi ụkọ ego dị n'iji arụpụtala ihe dị iche iche chere gọọmentị n'ihu.

Onyeisiala Buhari sị na dịka ọ bụ ọrụ dịrị gọọmentị ya ịrụ akụrụngwa dị n'obodo na ọ bụ nke a.

O kwuru na minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekweela ya ngwa na a ga-arụcha ọdọụgbọelua n'oge na-adịghị anya.

Cheta na o ruola ihe dịka izuụka itoolu gọọmentị mechiri ọdọụgbọelu ma kwuo na a chọrọ ịrụzi ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

A ga-ebelata ego ndị ụlọọrụ gọọmentị ji eme njem

Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ka ebelata ego ndị ọrụ gọomentị gbalitere n'ọkwa.

Site ụgbụa gawa n'ihu,

1) Nanị ụbọchị onye ọrụ a kwesịri i nọ maka nzụklo ọbụla ka gọọmenti ga akwụ ụgwọ ya.

2) Onye ọbụla na-aga nkem ga egosi akwụkwo na-egosi ihe kpatara o ji eme njem.

3) Ọ bụ nanị njem gbasara gọomenti ka a ga agwụ ụgwọ ya.

4) Mmadụ anọ nani ga eso ndị minista eme njem nke ga agunye 'Director', 'Schedule Officer' na onye enyemaka Minista. Ndị minista ka n'ọkwa bụ mmadu atọ.

5) Onyeisiala kwuru na ọ bụ nani ụgboro asatọ ka gọomentị ga-akwụ ụgwọ njem n'afo. kama,ndị minista, 'Permanent Secretary', onyeisioche ndị 'Extra-Minsterial Departments', 'Chief executive officers' na ndị 'Director'.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ndịagha Naịjirịa esila n'ịgba Egwueke banye Atilogwọ Udo

Ndị agha Nigeria

Ebe foto si, Getty Images

Ndịagha Naịjirịa sị na emume 'EGWUEKE' ha na-eme n'ọwụwanywnụ Naịjirịa ga na-aza zi 'ATỊLỌGWEỤ UDO'.

Ozi a dị n'akwụkwọ ozi si n'akara Twitter ha bụ nke onye nghazi mgbasaozi ha bụ Aminu Iliyasu tinyere aka na ya.

Aha onyonyo, Ndị agha Naịjirịa were nwayọ na-akpasu ndị otu IPOB

Emume a dịka ha si kwuo bụ nke ha na-eji azụ ndịagha n'ụzọ dị iche iche malitere n'afọ 2016.

Ndịagha sị ha na-ejikwa emume a ememina mpụ ndị dịka ohi, ntọrị mmadụ, agha ndị otu nzuzo, esemokwu dị n'etiti obodo nakwa ndị ọzọ.

Ha kwukwara na mgbanwe aha emume apụtaghị na usoro e ji eme ya agbanwela, na usoro niile ha ji eme ya ka kwụ etu ọ dị na mmalite.

Cheta na ọ bụ n'oge emume 'EGWUEKE' nke afọ 2017 ka ndịagha wakporo ụlọ onyendu Ipob bụ Nnamdị Kanu dị n'Afara Ukwu Ibeku Umuahia nke Abia Steeti.

Boris Johnson sị na Briten na UK enweela nkwekọrịta

Boris Johson

Ebe foto si, PA Media

Otu 'European Union' na mba Briten enweela nkwekọrịta maka etu Briten ga-esi hapu EU dịka Praịm Mịnịsta Briten bụ Boris Johnson sị kwuo.

Ha nwere mkparịtaụka a n'Obodo Brussels nke dị na mba Belgium.

Johnson kwuru na "anyị enwetela ezigbo nkwekọrịta ga-enye anyị nnwereonwe".

Ọ teela ndị isi mba abụọ a ji enwe mkparịtaụka maka ọdịmma onwe ha ma ọ bụru na Briten hapụ EU, mana nkwekọrịta a ha nwere ka ga-aga n'ihu ndị omeiwu mba Briten nakwa nke ndị EU iji binye ya aka.

Mana ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị a kpọrọ 'Democratic Unionist Party' (DUP) ka na-ekwusi ike na ha akwadoghi nkwekọrịta a.

Ndị pati a bụ nke ndị Northern Irish ekwubụọla na ha agaghị atụkwasi obi n'okwu Johnson.

Onyeisi ndị anọghị n'ọchịchị bụ Jeremy Corbyn boro aka n'isi tie mkpu sị na mkpebi a Johnson na aṅụrịrị kakwa njọ karịa nke Theresa May nwetere.

Corbyn kpọkuru ndị otu ya ka ha ghara ịge Johnson nti n'ihi na okwu ya bụ okwu onye awụrụaka.

N'aka ọzọ onyeisi European Commission bụ Jean-Claude Juncker sị na ya bụ mkpebi dị mma n'ụzọ ga-abara mba abụọ ahụ uru.

Aisha Buhari na ndị enyemaka ọhụrụ

Aisha Buhari

Ebe foto si, Aisha Buhari Facebook

Nkọwa foto, Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya

Ị nụrụ na nwunye onyeisiala bụ Aisha Buharị enweela ndị enyemaka mmadụ isii ọhụrụ.

A nụrụ na ndị a gụnyere Mairo Almakura, Muhammed Albishir na Wole Aboderin.

Ndị ọzọ bụ Aiyu Abdullahi, Zainab Kazeem na Funke Adesiyan.

Aisha ji ohere a arịọ mgbaghara maka ya bụ ihe onyonyo pụtara na sochịal midia ebe ọ na-abamba.

Trump ekweghị ojiji

Donald Trump

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha

Akọgbuola onyeisiala Trump n'ọnụ maka mkpọpụ ọ kpọpụrụ ndịagha Amerịka na Syria.

Trump n'onwe ya achọkwaranụ ịma, ebe ọ na-ekwu na Amerịka abụghị ndị uweojii mbaụwa.

A na-eche na ọ bụ maka ọpụpụ a Amerika pụrụ mere ndị Turkey ji malite ibuso ndị Kurd agha ọzọ.

Egwu a chaala Pogba

Paul Pogba

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Paul Pogba a gbaala ise n'ime asọmpi asato Manchester United gbara n'ọgbọ a

Kedu ka ị sị hụ ọnọdọ Manchester United n'Asọmpi ha na Liverpool na-aga ịgba?

Onwebeghi onye ma ebe ha bụ asụrụ asụ dewere ọdụ ebe a sị na Paul Pogba agaghị esokwa gba ya bụ bọọlụ.

Anyị nụrụ na Pogba merụrụ ahụ dịka ojisiaghọ mgbo ha bụ de Gea.

Gee akụkọ ndị n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị taa

Aha onyonyo, Mama Jessie Onuigwe: Mama dị afọ 104 ji ọrụ ugbo zụọ ụmụ ya

Akụkọ ga-amasị gị taa