Malitenu ọrụ n'ọdọugbelu Enugu nke taa nke echi - Ndịomeiwu

Ụfọdụ ndị ụlọomeiwu nta si ọwụwa anyanwụ akpọkuola Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o tinye ọnụ n'okwu gbasara ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.
Obi adịghị ha mma etu e si kpọchie ọdọụgbọelu ahụ kamgbe izuuka isii gara aga, na-enweghị ọrụ ọbụla a na-arụ na ya.
N'ọgbakọ ha nwere n'ụbọchị Wenezdee, ndị omeiwu a kpọrọ oku ka e mee ngwa ngwa dozie ọdọụgbọelu ahụ.
Ndị binyere aka n'akwụkwọ ahụ gụnyere Toby Okechukwu, Nkeiruka Onyejocha, Pat Oziokoja, Ofor Chukwuegbo na Amadi Dennis.
Ndị ọzọ gunyere Oke Martins, Nnaji Cornelius, Simeon Atigwe, Blessing Onuh, Uko Nkole, Darlington Nwokocha, Valentine Ayika, Francis Agbo na Benjamin Mzondu.

Ebe foto si, Twitter/ @nkeiruka_reps
Ndị omeiwu ahụ gosiri mwute na kamgbe e mechiri ọdọụgbọelu ahụ, onwebeghị ndị e nyere ọrụ idozi ya.
Ha kwukwara na ọdọụgbọelu ahụ bu nke dịkarịsịrị mkpa na mpaghara ọwụwa anyanwụ nile.
Ha kpọkukwara ngalaba na-ahụ maka ịrụ ụzọ ka ha mee ngwangwa imezi ụzọ ndị dị n'ala Igbo iji belata ahụhụ ndị mmadụ na-ata n'ụzọ.
Cheta na gọọmentị etiti mechiri ụdọụgbọelu Akanu Ibiam kemgbe ọnwa Ọgọst maka nrụgharị ya maka onwebeghị onye ọrụ ahụru ebe ahụ maka ya bụ atụmatụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










