NYSC Camp: Ndị ji asambodo adịgboroja akarịala - NYSC
Akụkọ dị mkpa:
Anyị nwụchiri ndị ji asambodo adigboroja - NYSC

Ebe foto si, TWITTER/@NYSC_NG
Ngalaba na-ahụ maka ndị ji otu afọ efe ala nna ha bụ NYSC sị ha nwụchiela ụmụakwụkwọ dị iri itoolu na ise ji asabodo adịgboroja bịara ife ala nna ha.
Onyeisi NYSC bụ Brigadier General Shaibu Ibrahim kwuru nke na wednezde n'oge ọmụmụ ihe ịnabata ndị agba ọ hụrụ.
Ọ sị na mmadụ iri isii na ise n'ime ha sị na mahadum ndị nọ na Naịjirịa ebe iri atọ si na madahum na-anọghị na Naịjirịa.
Ọ kwara arịrị maka etu ịkpụ asamboso adịgboroja si arị ibe ya elu na Naịjirịa na ọ bụ n'ihi nke a mere ha ji hiwe ọmụmụ ihe a.
Atụmatụ ga-emegide idina ụmụakwụkwọ na Madadum

Ebe foto si, Nigerian senate
Ndị ụlọomeiwu etinyela atụmatụ iwu ga-egbochi ndị nkuzi idina ụmụakwụkwọ ha na mahadum .
N'ozi osote onyeisi ndị Sịnetị bụ Ovie Omo-Agege kwuru na nyocha ọhụrụ a BBC wepụtara ga-enye aka ịkwalite ime ga atụmatụ a bụrụ iwu na Naịjirịa.
a gụpụtara iwu n'ụlọomeiwu na Wednezde, ọ bụrụ na e mee ya dịka iwu, ọ ga-ara onye nkuzi ahụ ịchọ idina nwata akwụkwọ.
Bọjetị a bụ nke ụtụ isi - Abaribe

Ebe foto si, Twitter/Bashir Ahmad
Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchite anya Abia South n'ụlọomeiwu akatọọla akwụkwọ mkpata na mmefu nke 2020 ma kwuo na ọ bụ bọjetị ụtụ isi.
Cheta na onyeisiala Buhari gụpụtara akwụkwọ mkpata na mmefu a ọ kpọrọ bọjetị maka mwulite akụnaụba na ọrụ n'ihu ndị ụlọomeiwu ụnyaahụ.
Ndị omeiwu Naịjirịa ekwela nkwa na ha ga-agba mbọ ihụ na ha mechara nnyocha atụmatụ nweta na mmefu ego maka afọ 2020 tupu ọnwa Nọvemba agwụ.
Benjamin Kalu bụ ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu nta gwara ndị ntaakụkọ nke a na ụnyaahụ.
O kwuru na ha ga-agbalị ịhụ na Bọjetị nke afọ 2020 malitere n'ọnwa Janụwarị kpọmkwem.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
N'okwu ya, ụlọomeiwu ahụ ewepụtala abalị iri atọ nke ọnwa Ọktoba ruo abali ise nke ọnwa Nọvemba maka ngalaba gọọmentị dị icheiche ịbịa kọwaa etu ha ga-esi mefuo ego n'afọ 2020.
"Anyị agaghị anabata ngalaba ọbụla na-abịaghị kọwaa bọjetị ha ma Nọvemba 5 gachaa."
"Nọvemba 6 ka anyị ga-amalite ikpokọta nakwa ịhazi bọjetị ngalaba dị icheiche ruo Nọvemba 27."
"Anyị na-atụ anya na anyị ga-emecha ihe niile gbasara Bọjetị 2020 na Nọvemba 28."
Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari wepụtara Bojetị 2020 n'ụbọchị Tuzde, abalị itolu nke ọnwa Nọvemba.
Bọjetị ahụ gosiri na Naịjirịa ga-emefu ego dị tarị naịra iri na ụma atọ na atọ n'afọ na-abịa abịa.
Na Turkey

Ebe foto si, AFP
Ụgbọelu agha ndị Turkey agbala ogbunigwe na mpaghara ugwu mba Syria n'ihe iwe bụ nke nwereike ibute agha n'etiti ha na ndị agha nnupuisi Kurdish.
Onyeisiala mba Turkey bụ Recep Tayyip Erdogan sị na nke a bụ iji chụsaa ndị agha Kurdish ma mee ka nchekwa dị n'ogige ahụ.
N'egwuregwu

Ebe foto si, AFP
Nkeji
Ihe nkiri
N'Amerịka

Ebe foto si, AFP/Getty
Ụlọọrụ onyeisiala Donald Trump ekwuola na ha agaghị akwado nnyocha nke ndị omeiwu mba ahụ na-enyocha onyeisiala iji chutuo ya n'ọkwa.
Ha kwuru na nnyocha ahụ enweghi isi na ọdụ bịa bụrụkwa ihe na-adabaghị n'iwu mba Amerịka.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu egwu bọọlụ mba Ịngland ekwekọrịtala na ha agaghị anabatazi ịkọ ọnụ agbụrụ n'asọmpị ha na-agba iji tozuo isonye n'egwuregwu Euro 2020
Tammy Abraham gwara ndị ntaakụkọ na ha kwekọrịtara na ha ga-akwụsị ịgba bọọlụ ma si n'ama egwuregwu pụọ.
Mba Ịngaland ga-ezute ndị Chek Rịpọblik n'ụbọchị Fraịde, abalị iri na otu nke ọnwa Nọvemba ma zutekwa Bulgeria ụbọchị Mọnde, abalị iri na anọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:












