Sex for Grades: Unilag achụọla ndị nkuzi abụọ BBC gbara n'anwụ

Boniface Igbeneghu na Samuel Oladipo
Nkọwa foto, Boniface Igbeneghu na Samuel Oladipo
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Mahadum Legọs achụọla ndị nkuzi abụọ BBC gbara n'anwụ maka ịchọ idina ụmụ akwụkwọ ha.

Ọ bụ n'ụbọchị Wenezde ka Mahadum a wepụtara akwụkwọ ozi were kwuo na Boniface Igbeneghu na Samuel Oladipo abụzighi ndị nkuzi ha malite n'ụbọchị 31 nke ọnwa Mee afọ 2021.

Ọ fọla obere ka o ruo afọ abụọ BBC wepụtara akụkọ a nke gosiri ebe ndị nkuzi abụọ a chọrọ idina ụmụakwụkwọ ha n'ike, mana ha amaghị na ndị ha che bụ ụmụakwụkwọ bụ ndị ntaakụkọ nzuzo.

Oge BBC wepụtachara akụkọ a, Mahadum Unilag hibere kọmitee ga-eleba anya na ebubo ahụ.

UNILAG kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Mọnde ka ndị isi ụlọ akwụkwọ ahụ nwere ọgbakọ iji leba anya na mpụtara nnyocha nke kọmiti ahụ mere, ha were kwekọrịta na ha ga-achụ Ọkammụta Samuel Oladipo na Boniface Igbeneghu n'ihi ajọ agwa ha kpara.

Lee ihe ndị meburu oge BBC wepụtachara akụkọ a ọhụrụ:

A kpọchiela ụzọ Dkt Boniface Igbeneghu na Unilag

Ọnụ ụzọ ụlọ ọrụ Dr Boniface Igbenegbu na Unilag

Ozi si n'ọnụ ụmụakwụkwọ mahadum Unilag apụta n'ụtụtụ a bụ na otụtụ ndị nkuzi Unilag ekweghị anabata ụmụakwụkwọ ụnayahụ n'ime ụlọakwụkwọ ahụ.

Ọnụ ụzọ ọrụ Dkt Igbenegbu

Nke a na-eme dịka ụlọọrụ BBC wepụtachara ihe nkiri gosiri ka ndị nkuzi na-ememina ụfọdụ ụmụakwụkwọ na mahadum Unilag nakwa nke Ghana.

Mahadum Lagos

Ebe foto si, Getty Images

Kirie ya bụ ihe nkiri n'uju ebe a ka ịhụ ndị nkuzi niile agbara n'anwụ:

Skip YouTube post
Hapụ Google YouTube ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Google YouTube. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Google YouTube iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of YouTube post

Mahadum Unilag kwusituru Dọkịnta Boniface Igbeneghu ma kwụsị ikwụ ya ụgwọ ọnwa.

Unilag

Ebe foto si, Unilag

Nkọwa foto, Akwukwo ozi Unilag gosiri iwe ha na etu ha si machi Igbeneghu

Mahadum ahụ gakwara n'ihu mechie ebe ahụ ọ kpọpụtara dịka 'ụlọ oyi' bụ ebe ọ sị na ndị nkuzi na-apị ụmụnwaanyị aka n'ara.

Cold Room

Ụka 'Four Square' agbarụọla ihu ma kwuo na ha kwọpụla aka n'isi Dọkịta Boniface Igbeneghu bụkwa ụkọchukwu ha.

Boniface

Ebe foto si, BBC/Four Square facebook

Ha kwuru na ha ahụla ihe nkiri na-egosi agwa ọjọ ọ kpara ma na-ekwu na ha ga-achọta ntaramahụhụ dị mma nye ya ma ha mecha nchọpụta ha.

Ụmụakwụkwọ Unilag na-ekwu na ha ahụbeghị onye nkuzi ahụ n'ụlọakwụkwọ kamgbe ihe a mechara.

Akwụkwọ ozi

Ebe foto si, Four Square Facebook

Ihe ndị Ghana na-ekwu maka atụmaatụ a

Ọ bụghị naanị onye nkuzi Unilag ka agbara n'anwụ n'ihe nkiri gosiri ka ndị nkuzi mahadum si edinaa ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi Ghana abụọ akpọrọ Ransford Edward Gyampo nakwa Paul Kwame Butakor na-akụzi na Mahadum Ghana sokwa. Lekwa ka ụmụakwụkwọ ya si nabata Butakor taa n'ụlọakwụkwọ ebe ọ na-akụzi.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Njiji ejiwela ebe akụkọ na-akọ na soshal midia kamgbe ngalaba BBC akpọrọ 'Africa Eye' wepụtachara ihe nkiri gosiri ebe onye nkuzi Unilag na-arịọ ka o dinaa nwataakwụkwọ ya.

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu katọrọ agwa a ebe ọtụtụ ụmụakwụkwọ na-ekele ụlọọrụ BBC maka etu ha si mee ya bụ nchọpụta.

@atiku kwuru na agwa bụ nke ekwesighị ịnabata ma na-arịọ ka ewepụta ụzọ tọrọ atọ a ga-eji kwụsị ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ihe ndị nkuzi Unilag kwuru maka atụmaatụ a

Onye nkuzi Unilag na-achọghị ka-akpọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ nụtụla ka ụmụakwụkwọ na-akọ maka ihe dị otu a.

Mana o kwuru na ufọdụ oge, ọ bụ ụmụakwụkwọ na-akpata ya.

Mgbe anyị jụrụ ya kedụ etu ọ bụ, o kpọpụtara ihe ndị a.

  • Ụmụakwụkwọ ụfọdụ na-eyi akwa na-egosi ime ahụ aga n'ime ụlọọrụ onye nkuzi nwoke.
  • Ụmụakwụkwọ dị umengwu na-adabakarị n'udi ọnwụnwa a.
  • Ụmụakwụkwọ na-achọ ka ha nweta ogo di elu ma ha edetara ma ha edeteghi n'ule.

O kwuru na ihe ya mere mgbe ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị gwara ya maka ndị nkuzi na-enye ha nsogbu bụ na ọ gwara ha ka gaa kpesa n'aka ngalaba na-ahụ maka itụzirị ụmụakwụkwọ ụzọ ziri ezi.

O nyere ụmụakwụkwo ndụmọdụ ka ogo ọbụla ha nwetere n'ule ju ha afọ ka ndị nkuzi ghara ịji maka oke ọchịchọ na-anwa ha ọnwụnwa ndịna.

Lee ụfọdụ ndị mmadụ kwuru n'elu soshal midia

@DrJoeAbah toro nwata nwagbọghọ ahụ wepụtara onwe ị ga-arapụta ndị nkuzi na-eme arụrụana a.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

@matthewamad kwuru na ekwesiri inye nwada ahụ so BBC ga mee nchọpụta ahụ nturuugo pụrụiche.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

@weirdoonthebloc na-ajụ kedụ ihe bụ 'ụlọ oyi' akpọrọ aha n'akụkọ a.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

@UgonnaOkere1 kwuru na ọ bụ iko nwoke a juru eju.

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 6

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Aha onyonyo, Ọka mmụta Boniface Igbenehue