Sex Trafficking: Ụmụagbọghọ Afrịka a tọrọọ gaa ịgba akwụna na India
Ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị Afrịka nọ na mba India agba akwụna.
Nchọpụta BBC 'Africa Eye' mere gosiri na ụmụnwaanyị ndị a akpachaghị anya na-eme nke a.
E nwere otu ndị ekperima ndị aka ọrụ ha bụ ịghọgbu ụmụnwaanyị ka ha si Afrịka bịa India.
Ha na-ekwe ụmụnwaanyị ndị a nkwa ọrụ dị iche iche ga-enye ha ego, mana otu abụghị n'ezi.
Ọtụtụ ụmụagbọghọ ndị a bụ ndị mba Kenya, Uganda, Nigeria, Tanzania nakwa Rwanda.
BBC 'Africa Eye' sooro otu onye n'ime ha aha ya bụ Grace wee gaa India ịchọpụta nke bụ eziokwu.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:


