Operation Python Dance: Kedụ ebe a ga-agba Egwu Eke nke 2019?

Ndị agha Nigeria

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị agha Naijirịa si na ha adila njikere imalite atụmatụ nkwado ọrụ ha kpọrọ Egwu Eke n'Ọwụwa Anyanwụ.

Atụmatụ a ga-eme na mpaghara di iche iche na Naịjirịa mana aha ha dị iche iche.

N'Ọwụwa Anyanwụ ha ga-eme Egwu Eke n'Abịa, Anambara, Ebonyi, Enugwu na Imo.

N'etiti Ugwu (Benue, Nasarawa, Kogi, Taraba na Kaduna) ha nwere nke ha kpọrọ Ayem Akpatuma.

Na Ndịda Naịjirịa na Ọdịda Anyanwụ (Akwa Ibom, Rivas, Cros Riva, Delta, Edo, Legọs na Ogun) ọ bụ nke akpọrọ "Crocodile Smile".

Ndi agha sị na atụmatụ ndị a bụ iji nye aka maka nchekwa ka ha ji eme ihe a.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ha kwukwara na atụmatụ nke a kpọrọ "Operation Positive Identification" bụ nke ha na-eme na mpaghara Ugwu maka ndị oyi egwu bụ Boko Haram na IS ga-emechaha gazuo Naịjirịa niile..

Ihe 'Operation Positive identification' pụtara bụ na mmadụ niile na-eme njem maọbụ ndị bị n'obodo ga-egosi akwụkwọ njirimara tupu ha agafee mgbochi ndị agha tinyere n'okporo ụzọ.

Akwụkwọ njirimara a nwere ike ịbụ nke "National Identity Card", "Voters Registration Card", "Drivers License", "International Passport" maọbụ ihe ọzọ nwereike igosi onye mmadụ bụ.

Ndi agha na onye na-eme njem

Ebe foto si, @HQNigerianArmy

Nkọwa foto, Ha kwuru na atụmatụ a amịtala mkpụrụ na mpaghara ugwu

Ọ bụ ngalaba ndịagha nke 2, 6, 81 na 82 ga ahazi nke a.

Ha kwuru na atụmatụ a ga-ebido n'abalị asaa nke Ọktoba ruo abalị iri abụọ na anọ nke Disemba n'ebe dị icheihce.

Ndị agha Naijirịa gakwara n'ihu gwa ndị Naijiria nille ha atụla ụjọ ma ha hụ ndị agha, ndị nchekwa ndị ọzọ maọbụ ụgbọala eji alụ agha n'okporo ụzọ.

Ha kwukwara na ha ka dị njikere ichekwa Naijiria.

Onye agha na ndị ji kaadi nkọwa

Ebe foto si, @HQNigerianArmy

Nkọwa foto, Ha kpọrọ nke mpaghara ugwu 'Ayem Akpatuma'

Cheta na ọ bu n'ọnwa Sepụtemba nke afọ 2017 ka ndị agha sitere n'ikike "Egwu Eke" were wakpo Afaraukwu bụ obodo Nnamdi Kanu nke mere ka ọ gbapụ na Naịjirịa.

Ma rụo taa, ndị obodo Afaraukwa ka na-akọ akụkọ mkpamkpa ndị agha kpara n'obodo ha oge ahụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụko ga-amas g:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ọka mmụta Boniface Igbenehue