IPOB: Atụmaatụ Egwu Eke chụpụrụ Nnamdi Kanu -Buratai

Kanu/Buratai

Ebe foto si, Getty Images/Paul Achalla

Ọ fọrọ obere ka Egwu Eke II loo onye ndu Indigenous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu.

Onye kwuru nke a bụ onye ndu ndị agha Naịjirịa, Tukur Buratai.

Buratai gwara ndị Naijirịa mgbe ọ na-emepe atụmaatụ a nke atọ na Lagos, na ya bụ Egwu Eke ha mere n'afọ 2016 nyere Nnamdi Kanu mbọbọ ọsọ.

N'okwu ya, " ya bịa ọgụ maọbụ na ọ chọọ."

Ọ bụrụ na ọ nwara anwa bịa ọgụ, Eke a ga-elo ya lomie ya.

O jikwa ohere a gwa ndị omekome nọ na Lagos nakwa Ogun steeti ka ha gbara ọgwu ha nụọ makana Egwu Eke III ga-elo ha ma ha nwaa gosi ihu ha.

Tukur kwuru na atụmaatụ a bụ iji kwado atụmaatụ ndị agha na-eme n'ụfọdụ akụkụ Naịjirịa maka idozi ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Burn survivor: Onye nwere apa gbalịa nabata ya - Kay Obum