Ndị agha : Anyị ga-amalite 'Egwu eke' nke atọ
Gọọmenti Naịjirịa kwụrụ ụgwọ n'isi ụmụaka Dapchi - UN

Ebe foto si, Yobe State Government
Otu United Nation ekwuola na nyocha ha mere gosiri na gọọmentị Naịjirịa kwuru ụgwọ iji gbapụta ụmụakwụkwọ Dapchi a tọọrọ n'ọnwa Febụwarị.
Dika otu ahụ siri kọwa, inye ego soo ewelite mkpamkpa otu Boko Haram na-akpa na mpaghara Naijiria na Chad.
Mana mịnịsta mgbasa ozi bụ Lai Mohammed gọrọ na o nweghị ego ọbụla gọọmenti kwụrụ iji gbapụta ụmụada Dapchi.
Anyị ga-amalite "Ekwu Eke nke atọ" - Ndịagha

Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha Naijirịa ekwuola na ha ga-amalite "Egwu Eke" nke atọ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ n'oge na-adịghị anya.
Okwu a si n'ọnụ GOC nke 82 Division bụ Emmanuel Boman Kabuk pụta na njem nleta o mere n'Ọnicha ụnyaahụ bụ Tọọsde.
Akụkọ mba ofesi:

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ụka katọlik n'ụwa niile bụ Pope Francis ekwuola na ọ kwụsị ike n'akụkụ ndị niile ahụ ekwuru na ndị ụkọchukwu katọlik metọrọ na Pennsylvania.
O kwukwara na ọ dị mma ka e gee ndị a ntị iji chọpụta ebe mmiri si baa n'opi ụgbọghọrọ.
Akụkọ Egwuregwu:

Ebe foto si, Getty Images
Ihe na-ewu ugbua na mba Italị bụ ihe a kpọrọ 'Mmetụta Cristiano Ronaldo' nke bụ 'Cristiano Ronaldo effect' n'olu bekee.
Nke a pụtara na okenye, nwata, nwoke na nwaanyị na-eyizi uwe bụ aha nwaamadị a kemgbe ọ gafere otu Juventus.































