Babcock sex video: Ebe ụmụakwụkwọ abụọ mahadum Babcock siri 'daa iwu'

Babcook University

Ebe foto si, @Babcock_Univ Twitter

N'ụbọchị Wenesde ka mahadum a chụpụrụ otu nwata akwụkwọ ha pụtara na otu ihe nkiri ebe ha na-akwa iko nke na-ewu na sochal midia.

N'ime akwụkwọ mgbasaozi mahadum a zitere BBC, site n'aka ọnụ na-ekwuru ha bụ Joshua Suleiman sị na ihe a mere kamgbe ọnwa Epụrel.

O kwukwara na ọ bụghị n'ime ụlọakwụwkọ Babcock ka ha kwara iko a.

"A chụrụ nwoke ahụ nọ n'ime ihe onyonyo a n'ọnwa Febụwarị nke afọ a ka e mechara nyocha chọpụta na aka ya dị n'ime ajọ agwa a kpara n'ime ụlọakwụkwọ a."

Akwụkwọ mgbasa ozi ahụ kwukwara na a chụọla nwaada ahụ ya na nwoke ahụ kwara iko n'ime ihe onyonyo ahụ.

Ihe gbakara ụfọdụ mmadụ isi nke mere ha jiri na-ajụ ihe kpatara nke a.

Dịka o si kwụrụ ugbua, ụlọakwụkwọ a gbagidere ụkwụ n'iwu mahadum ha medidere ụdịrị agwa.

Babcock bụ mahadum ụlọụka e ji Sabat mara n'ala Igbo nwe - nke pụtara "Seventh Day Adventist Church" na Bekee.

Babcock university so n'ime mahadum ndị nkiti nwe na Naịjirịa malitere n'afọ 1999.

Lee ihe kwesịrị ịma maka Mahadum Babcock

Babcock University

Ebe foto si, Babcock University

Nkọwa foto, Babcock University

1) Ha na-erube isi n'omume ndị Sabat na mahadum ahụ

Dịka anyị ekwuola na ọ bụ ndị Sabat nwe ya bụ mahadum nke mere ha ji erube isi n'emume ụka Sabat na-amlite namgbede Fraịde rue ehihe Satọde.

2) Iwu megidere iyi aka na-amakụ ahụ

Akwa ọbụla na-amakụ ahụ esoghi n'ụdịrị akwa a na-ekwe ka ụmụakwụkwọ yiri na mahadum a.

Mahadum a na-akpasị onye ọbụla yi ụdịrị akwa bịa akwụkwọ ka onye chọrọ iwakpo ndị mmadu n'ike.

3) Nwoke nanwaanyị ekwesighi iso na-aga ụfọdụ ebe n'ụfọdụ oge.

Mahadum a machiri ụmụnwoke na ụmụnwaanyị iso na-agagharị n'ụfọdụ ebe n'ụfọdụ oge.

Ha sị na o bụ ezigbote nsogbu ma ha hụ ndị mmadụ n'ụdịrị ọnọdụ a.

4) Anaghị anabata uwe jean na trawụza "pencil"

Uwe jean, bụ uwe ndị mmadụ kachasị eyi n'ụwa sokwa n'ihe a machiri na ya bụ mahadụm.

Uwe ụmụnwaanyi dịka "skirt" dị n'elu ikpere so kwa n'ihe a nabataghị.

trawụza agbadaghị ala nkeọma sọkwa n'ahịa iwu.

5) Adịghị eyi ọla na iyeri

Iyi iyeri ntị, iyeri imi, nke ire, nke ara na iyeri ọnụ so n'ihe ha machiri.

A machikwara ịkpụ ụfọdụ isi.

6) Ụmụakwụkwọ adịghi esi maọbu rie anụ

Mahadum a adịghị ekwe ka esie nri n'ebe obibi ha. Ha adịghi iri anụ, ihe ha na-eri bu ihe a kpọro "tofu".