Ịchụ onyenkuzi chọrọ idina nwataakwụkwọ n'ọrụ ezughi -ICPC
Kọmishọn na-ahụ maka ihe gbasara mpụ na mmehie dị icheiche ekwuola na ha anabataghị ọchụchụ achụrụ onyenkuzi chọrọ idina nwataakwụkwọ ya na mahadum Obafemi Awolowo.
Ha kwuru site n'ọnụ kọmishọna na-ahụ maka agụakwụkwọ ha bụ Mohammed Bade na mahadum ahụ kwesiri ị nyocha ọkammụta Richard Akindele maka akụkọ a.
O si "N'agbanyeghị na mahadum achụọla ya (Akindele) n'ọrụ, anyị na-atụ anya na a ga-eme ya nyocha zuru oke ma kpụpụ ya ụlọịkpe maka nke a".
Bade kwuru na ọ dị mkpa iji chekwa ụmụnwaanyị na-agụ akwụkọw na mahadum dị icheiche n'ihi na ụdị omume a buru ibu n'etiti ndịnkuzi na ụmụakwụkwọ mahadum.
Ọkammụta Richard Akindele bụ bu onyenkuzi na mahadum Obafemi Awolowo chọrọ idina nwataakwụkwọ ya tupu ọ gafe ule.

Ebe foto si, OAU Facebook page
Achụrụ ọkammuta ahụ n'ọrụ mgbe mahadum ya mere nyocha chọpụta na nwata akwụkọ ahụ gafere ule ya ma jide kwa olu ọkammụta ahụ mgbe ọ na-agwa ya na ọ ga-edina ya.






























