OAU achụọla onyenkuzi ha maka ebubo ndina maka ịgafe ule

Aha onyonyo, OAU achụọla onyenkuzi ha maka ebubo ndina maka ịgafe ule

Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ọkachasị ụmụnwaanyị tọrọ Obafemi Awolowo University,(OAU) Ile-Ife dị n'Ọsun steeti maka ụgbọ nwamkpi ha gbara onye nkuzi ha bụ Prof Richard Akindele maka ebubo ịchọ idina nwaakwụkwọ ya iji nyere ya aka igafee ule.