'Ọdighị n'iwu anyị iziga ndị kọpa n'ụlọ ọfụfe' - NYSC

Ebe foto si, TWITTER/@NYSC_NG
Ngalaba na-ahụ maka iji otu afọ efe ala nna bụ National Youth Service Corps (NYSC) agọọla aka na ụkwu ha maka akụkọ na-efeghari na soshal midia na-ekwu na ha na-eziga ndi ntorobia gaa ụlọụka maọbụ nke ndị alakụba maka ife ala nna ha.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuru NYSC nke Ondo steeti bụ Bankole Simeon kwuru na nke a bụ asi n'ihi na ebe ndi a esoghị na ebe iwu kwuru ka e ziga ndị ntorobịa.
O kwuru na onwetubeghị mgbe ndị NYSC ji ziga ndị ntorobia ga ụlọụka maka ife ala nna ha ma si kwa na ha agaghi eme ya eme.
Elele okporo ụzọ

Ebe foto si, Reuters
Gọọmenti etiti ekewaputala otu narị ijeri naira na ijeri iri isii na isii maka irụ okporo ụzọ ndị gọọment etiti nwe.
Okporo ụzọ si Aba gawa owerri, ụzọ NNPC di na Abia steeti ga eri N6.1B ma wee otu afọ na okara iji ruchaa ya.
Ọ bụ ụlọọrụ Roudo Nigerial Limited ga-arụ okporo ụzo a.
Ebe ụzo Oba-Nnewi-Arondizogu na Okigwe ga-erite elele N12.8B ma wee otu afo na okara iji ruchaa.

Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob etiela mkpu maka ndị e chere na ha bụ ndị Fulani nọ n'ihu be ya n'Isiama Afara-Ukwu n'Abia steeti.
O depụtara nke a site n'akara Twitter ya n'abalị satọde ma na-ekwu na a ga-agba onye ọbụla zitere ha n'anwụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
O boro ndị Fulani ebubo na ji ụgbọala Hilux dị ọcha akpagharị n'ihu be ya.
Kanu majara ha na s'ite n'okwu ya na 'ihe ịtụ anya na-eche ndị ahụ'.
Ndị mmadụ sara ya okwu na ya bụ Twitter dịka @Forma na-ekwu ka ndị nna nna ya nye ya ike.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ebe Afenifere si ya weta ihe akaebe ịgosi na okwu ya bụ eziokwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Mpụtara ọgbakọ pụrụiche ECOWAS
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Onyeisiala Muhammadu Buhari agwaala ndị isi ala ibe ya na mpaghara ọdịda anywanwụ Afrịka ha adana mba na mbọ niile ha na-agba iji hụ na ekpochapụrụ otu ndị na-eyi ndụ egwu n'ala ha.
Ọ gwara ha nke a n'ọgbakọ pụrụiche nke ECOWAS hibere n'ụbọchị satode na Burkina Faso.
Na mba Tunisia,

Ebe foto si, AFP
Tunisia na-akwado ịme ntụlịaka nke abụọ ha kemgbe afọ 2011 mgbe ha mere ngagharị iwe chutuo onyeisiala ochie ha bụ Ben Ali.
Mmadụ ruru iri abụọ n'isii so na ndị na-azọ ya bụ ọkwa onyeisiala kemgbe Beji Essebsi nwụrụ n'ọnwa Julai afọ a.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu Bournemouth ejirila ndị otu Everton were zaa aha dịka ha jiọkpụ goolu atọ asatara otu were lee ha ọbịa.
Mmeri a bụgotere Bournemouth na ọnọdụ nke asatọ ebe ndi Everton agbadala noro na onodụ nke iri na otu na Premiership.
Ebe nkata ndị Watford kpuchiri ndị Arsenal dịka ha satara goolu abụọ ndị Arsenal jiri emeri ha na mbido asọmpi ha.

Ebe foto si, AFP
Otu Athletics federation of Nigeria bụ AFN ahọpụtala mmadụ iri atọ na ise ga-anọchite anya Naịjirịa n'asọmpị ọgbọsọ mbaụwa niile ga-ebido n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa a.
Blessing Okagbare, Divine Oduduru nakwa Rosemary Chukwuma so na ndị ga-aga ya bụ asọmpị.











