Ogun state Murder: Otu nwoke ejirila ụra magbuo nwunye ya
Nwoke ji aka tigbuo nwunye ya

Ebe foto si, Nigeria Police Force
Ọnụ na ekwuchitere ndị uweojii nke Ogun steeti bụ Abimbola Oyeyemi ekwuola na ha ejikpala otu nwoke ji ụra magbuo nwunye ya na ya bụ steeti.
Kingsley Madukwe onye ihiala Anambra Steeti gbara afọ iri anọ tigburu nwunye bụ Glory Madukwe gbakwara afọ iri anọ maka na ọ jụrụ inye nwa ọhụrụ ha mmiri ara ka ọ ṅụọ.
Madukwe onye na-agba ọkada na nwunye ya ji ụmụ asatọ.
Ndi akaebe kwuru na akwa nwa kpọtere Madukwe n'ụra nke mere ka ọ gwa nwunye ya ka ọ ga-nye nwa ara.
Nwunye gwara ya na ike adighi ya.
Nkea kpaliri iwe di ya nke mere ka ọdọghachi ya were jiri iwe maa ya ụra.
Ọ bụ ụra a butere ọnwụ nwunye ya dịka ọ dara n'ala were laa mụo n'ihe dịka elekere iri na otu na ọma nke abalị.
Ka ọ di ugbua, etinyela ozu nwunye ya n'ụlọ ozu dị n'Otta, Ogun steeti ma nyefee di ya n'aka ngalaba uweojii pụrụ iche na-ahụ maka ogbugbu mmadụ.
Seun Onigbinde: Ụmụ Naijiria kpụ n'ọnụ dịka ọ nara ọkwa na gọọmenti Buhari

Ebe foto si, BudgIT/Facebook
Ụmụ Naijiria ebola Seun Onigbinde ebubo isoro mụọ gbuo mmadụ soro mmadụ akwa ya dịka ọ nara ọkwa n'ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari.
Onigbinde, onye nwe ụlọọrụ BudgIT na-ewu na soshal midia dịka o nwetara ọkwa 'Technical adviser' na ngalaba gọọmenti na-ahụ maka bọjeti. d
Mana akụkọ ahụ were ọtụtụ ụmụ Naijria ezigbo iwe dịka ọ bụ onye a mara na Twitter maka ịkatọ Buhari.
Ụfọdụ dịka @Ezeakachidozie gara bọpụta okwu ndị Onigbinde buburu maka Buhari na ọchịchị ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@sidramatics kwuru na Onigbinde ị nara ọkwa n'ọchịchị Buhari ma gbara ọsọ wepụ akara Twitter ya na-egosi n'ọbụ onye ego kachasị mkpa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@TosinOlugbenga kwuru na Pius Adesanmi nwụrụ anwụ buru amụma na ụbọchị ike Naijiria ga-akwụ ya bụ ụbọchị Onigbinde ga-agbaghapụ ihe ọ na-arụ na BudgIT gaa nara ọkwa n'aka gọọmentị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Mana ụfọdụ dịka @LifeOfRouvafe ahụghị ihe ọjọọ dị n'agwa Onigbinde kpara.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Adele agbaala di ya alụkwaghịm

Ebe foto si, Getty Images
Onye otiegwu ama ama bụ Adele Laurie Blue Adkins eji Adele mara ga-apụta n'ahia ndi na-ejighị dị dịka ọ gbara di ya alụkwaghịm.
Adele na di ya bụ Simon Konecki mere enyi afọ ise tụpụ ha alụo ka di na nwunye.
N'ime afo ise a ga ha mụtara otu nwa nwoke bụ Angelo.
Adele na di ya lụru na nzụzo n'afọ 2016.
Adele turu ụgo n'iti egwu nke mere na egwu nke atọ otiputara gara ahịa ma ree puku narị asatọ na izuụka mbu ya.
Mana isi sekpụ ntị ụgbụa bụ ego ole nwaamadị a bụ Konecki ga-enweta maka nkesa alụmdinanwunye ya na Adele.
Oke osisi adaala

Ebe foto si, @NOIweala
Ọnwụ akpọrọla Obi Chukuka Okonjo onye bubu Obi Ogwashiukwu ka ọ ga soro ndị ichie ibe ya zụo ike.
Obi Okonjo bụ Nna ọkonjo iweala nwụru na Legos dịka ọ si njem na mba Amerịka na Ghana lota.Ọ gbara afọ iri itolu na otu.
NLC hụrụ aka enwe n'ofe gọọmenti

Ebe foto si, AFP
Otu 'Nigeria Labour Congress' na-ekwu na nkata gọọmenti etiti kpara ibuli ụtụ isi nke a kpọrọ 'Value Added Tax' ga-eme ka mbuli ụgwọọnwa opekatampe ghara ibaziri ndị ọrụ uru.
Ha na-ajụ ma ụmụ ogbenye a ga-emezi aghaa?
Na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ ụnyaahụ, odeakwụkwọ ndị NLC bụ Emma Ugboaja kwuru na ha anabataghị mbuli ụtụ isi 'VAT' ahụ chaa chaa.
N'okwu ya: "Gọọmentị chọrọ iji ụzọ aghụghọ narakwa ndị ọrụ ego ha tinyere n'ụgwọọnwa opekatampe."
"Ihe a ga-eme bụ ime ka ọtụtụ ndị na-anaghị akwụ ụtụisi ha malite kwụwa, ọbụghị ibuli ego ụtụisi."
Cheta na gọọmentị etiti buliri ụgwọọnwa opekatampe site na puku naịra iri na asatọ ruo puku naịra iri atọ.
Mana amalaitebeghi kwụwa ya mmadụ niile.
Naịjirịa na Iran ekwekọrịtala ịchabi mmanụ

Ebe foto si, Getty Images
Otu Opec ekwekọrịtala ịchabi mmanu agbidi ha na-eresi mba ụwa.
Naịjiriịa na Iraq kwetara ịsonye na ya bụ ịchabi mmepụta mmanụ, ọkacha ụgbụa Amerịka kpopere pọmpụ nke ha.
Iraq, bụ mba nke abụọ kacha epeụta mmanụ agbidi n'otu Opec, ekwela ibelata mmepụta mmanụ ruo udu 175,000 kwa ụbọchị.
Ebe Naịjirịa ga ebelata aka ruo udu 57,000 kwa ụbọchị.
Ọnụahịa mmanụ agbidi na-ada n'ike n'ike n'ihi ahụhụ mba Amerịka na-ata mba Iran na Venezuela.
Davido na Chioma agbaala ngọrịngọ

Ebe foto si, INSTAGRAM/DAVIDO ADELEKE
N'akụkọ ọzọ, oti egwu a ma ama bụ Davido aghọkwaala ọgọ anyị o!
Davido egbuola ikpere n'ala jụọ enyi ya nwanyị bụ Chioma "biko, ị ga-alụ m?"
Gụọ akụkọ na ụjụ na ọbaozi anyị.
Mmerụahụ echiela Laporte aka n'ala

Ebe foto si, Getty Images
Onye egwu bọọlụ nke Manchester City bụ Aymeric Laporte agaghị enweike igba bọọlụ ọzọ tutu ọnwa Febuarị 2020 maka mmerụahụ.
Ọ bụ onyekuzi ha bụ Pep Guardiola kwuru na Laporte meruruahu na asọmpi ha na Brighton gbara nsonso a.
Ụmụnwaanyị eburula bata 18

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, Manchester City ji ọkpụ goolu asaa asatara otu saa ndị Lugano ahụ n'asọmpi Champions League nke ụmụnwanyị unyaahụ.
Ha kwukwara ya ekwu na ihe nwoke ga-emenwu, nwanyị ga-eme ya karịa.
Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji











