BBC 100 Women 2019: Kedu ndị aha ha so?

Images of many of the BBC's 100 Women 2019

BBC eweputala aha ụmụnwaanyị 100 ndị a ma ama kacha akwalite ma na ewepụta ihe ọhụrụ n'ụwa niile gburugburu n'afọ 2019.

N'afọ a ka ụmụnwaanyị 100 na ajụ: Kedu ka echi ga-adị ma ụmụnwaanyị bụrụ ndị ndu?

Aha ndị a gụnyere onye na-ese ụlọ chọrọ irụgharị mba Syria, Onye na edu ndị na-arụ ụgbọelu ga aga ụwa Mars na Nasa, ọtụtụ ụmụnwaanyị ndi edeputara aha ha bụ ndị ọkamụta n'ọrụ ha, Ha ga-akọwara anyi etu ha chere n'ụwa ga adi n'afọ 2030.

Ndị ọzọ gụnyere onye ndọrọndọrọ ọchichị 'ana amaghi' na emegide ndi otu nzuzo 'Mafia', ma kwa ndị na-agba bọọlụ na alụso ikpa oke maka na ha bụ ụmụnwaanyị, ndi a niile ji ndu ha egosi ndị ọzọ ụzọ .

mnwaany b ndị Afrka aha ha so bụ

100 Women profile pictures 1 - 20

9) Rida Al Tubuly - Onye na-achọ udo, Libya

Dịka ọgbaaghara di na mba Libya, otu nwaanyị bụ Rida Al Tubuly na-achọ ka enye ụmụnwaanyị ohere ka ha soro n'ọchịchị ya bụ obodo ka ha nwee ike dozie obodo Libya.

Otu ya bụ 'Together We Build It' na-achọ ụzọ i si dozie ma kwụsi ọgbaaghara na mba Libya.

N'afọ gara aga ka ọ gwara ndị na-ahụ maka ikike dịịri onye nke ndị UN na ha anaghị etinye ụmunwaanyị na nzụkọ gbasara ọdinihu Libya.

Tubuly bụ onye nkụzi na mahadum ma nwee kwa ntụrụụgo nke agụmakwụkwo ' International Human Rights Law'.

16) Judith Bakirya - Onye ọrụ ugbo, Uganda

Judith Bakirya bụ onye eji ọrụ ugbo zụọ bụ onye mbu n'ime ndị ebiri ya nwetara ntụrụugo ị ga-akwụkwọ sekọndịrị na-efu.

Mba Uganda nyere ya ntụrụụgo nke ọrụ ugbo.

O ji ohere a ekwusi okwu ike maka inye ụmụnwaanyị ikike ruru ha nke gụnyere inwe ala, ịgụ akwụkwọ na ikwusi imegbu ụmụnwaanyị n'ezinụlọ.

27) Salwa Eid Naser - Ọgba ọsọ, Nigeria/Bahrain

Salwa Eid Naser meriri 400 metres na Doha n'afọ a.

A mụru ya n'Anambra steeti kama ọ gara mba Bahrain dịka ọ na-achọ ebe ọ ga-enweta ohere ito dịka onye na-agba ọsọ.

28) Rana el Kaliouby- Onye na-arụ kọmpụta na-eme ka mmadu, Egypt

Rana el Kaliouby so na ndị mbụ bidoro rụwa igwe kọmputa na-eme ka mmadu n'Egypt.

Ihe na-amasi ya bụ ihụ na ụmụnwaanyị nwetere ohere ụmụnwoke na-enweta na Teknụzụ.

30) Lucinda Evans - Onye na azọchitere ụmụnwaanyị oke ruru ha, South Africa.

Evans na-agba mbo ihu na ụmụnwaanyi South Africa nwetere ikike ruru ha na-agbanyeghi na mwakpo na ogbugbu ụmụnwaanyi na-ari elu na South Africa

42) Asmaa James- Onye Ntaakụkọ/Onye na-akwalite ọdịmma, Sierra Leone

James na ekwuchitere ndị na enweghi etu ọha ha na Sierra Leone.

Ọ mere ka ụmụnwaanyị mba ahụ na-eyi uwe ojii iji na ụbọchị Tuzde nke ikpeazụ n'ọnwa niile dịka ụzọ ha si ekwu na ha achọghizi mwakpo ụmụaka ụmụnwaanyị.

Ihe kpaliri mụọ ya bụ mwakpo awakporo nwatakịrị dị afọ ise.

45) Gada Kadoda- Injinịa, Sudan

Dr Gada Kadoda na-ekuziri ụmunwaanyi bi na ime obodo etu ha ga esi were anwu adobata ọkụ latrik n'obodo ha.

47) Ahlam Khudr - Onyeisi ndị na-eme ngagharịiwe, Sudan

Onye bara onwe ya ' Nne ndị Sụdan niile nwụrụ maka ihe ha kwenyere', Egburu nwa Ahlam nwoke gbara afọ iri na asaa n'afọ 2013 mgbe a na-eme ngagharịiwe udo.

Kamgbe ahụ ka Ahlam wepụtara ndụ ya ịchọ ikpe ziri ezi maka ọnwụ nwa ya na kwa ịkwado ikike ruru ndị niile nwụrụ maọbụ ndị 'furu efu' na mba Sụdan.

55) Julie Makani - Dọkinta na onye sayencị, Tanzania

Julie etinyela afo iri na abụo iji chọpụta etu a ga esi agwọ ọrịa 'Sickel cell' ma na arụkwa ọrụ iji hụ na ndi mmadụ chọpụtara maka ọrịa ahụ.

61) Raja Meziane - Ọgụụ egwu, Algeria

Raja Meziane na eji egwu egosipụta mpu na nrụrụaka di n'ọchịchị mba ya.

96) Purity Wako - Onye ọzụzu maka ndụ , Uganda

Purity na-gba mbọ ihu na ụmụnwaanyị nwere ikike ruru ha n'ezinulo.

63) Benedicte Mundele - Onye na-azụ ahia nrị, Democratic Republic of Congo

O mepụtara ọtụtụ nrị sitere n'ime ji bekee na 'Passion Fruit' nke ndị ogbenye ga azụtanwụ.

69) Farida Osman - Onye na-egwu mmiri, Egypt

Ọ na ekwusi okwu ike ka ụmụakwụkwọ mahadụm tinye ụchụ n'ịgwu mmiri.

Osmann ritere ọla nchara n'igwu mmiri n'afọ a.

81) Nanjira Sambuli - Onye na-ahu maka ụmụnwaanyị i so na Teknụzụ Dijital, Kenya

Sambuli na-agba mbo ihụta na ụmụnwaanyị niile na mba Kenya nwere ike inweta ịntaneti.

83) Hayfa Sdiri - Entrepreneur, Tunisia

Mgbe ọ dị afo iri na isii ka o wepụtara ụlooru na abụghi maka ikpa ego bụ 'Entr@crush' ebe ndị ntoroọbia ga enwe ike inweta nkwado ma gụọ akwụkwọ n'ihe dị ka 'management' na 'accounting'.

O sokwara ndị UN rụọ ọrụ n'ihe gbasara oghata ọha na-ebe nwoke na nwaanyị.

90) Kalista Sy - Onye na-ede ma na eme ihe ejiji, Senegal

Ihe ejiji ọmepụtara nke akpọrọ 'Mistress of a married man' wuru ewu n'obodo ha.

Ihe ejiji a gosiri ụmụnwanyị na-eme ọfụma ma gosikwa nsogbu ndị lụru ọtụtu nwaanyị na ọrịa ụbụrụ .

Ụmụnwaanyị ndị ọzọ so na abụghị ndị Afrịka

1) Precious Adams- Ote Egwu, US

2) Parveena Ahanger - Ikike ruru onye, Indian-administered Kashmir

3) Piera Aiello - Ndorondoro ochichị, Italy

4) Jasmin Akter - onye egwuregwu Cricket, UK/Bangladesh

5) Manal AlDowayan - Nka, Saudi Arabia

6) Kimia Alizadeh - Taekwondo , Iran

7) Marwa Al-Sabouni- Architect, Syria

8) Alanoud Alsharekh - Ikike ruru ụmunwanyị, Kuwai

10) Tabata Amaral - Ndorondoro ochichị, Brazil

11) Yalitza Aparicio - Onye ihe ejiji , Mexico

12) Dayna Ash - Omenala, Lebanon

13) Dina Asher-Smith - Atọgbaọsọ, UK

14) MiMi Aung - 'Project manager' na Nasa', US

15) Nisha Ayub - 'Transgender rights activist', Malaysia

17) Ayah Bdeir - Onye azụmahia, Lebanon

18) Dhammananda Bhikkhuni - 'Monk', Thailand

19) Mabel Bianco - Dọkinta, Argentina

20) Raya Bidshahri - Nkụzi, Iran

100 Women profile pictures 21 - 40

21) Katie Bouman - Sayence, US

22)Sinead Burke - Ikike diiri ndi meruru ahụ, Ireland

23) Lisa Campo-Engelstein - 'Bioethicist', US

24) Scarlett Curtis - Ode akwukwo, UK

25) Ella Daish - 'Environmentalist', UK

26) Sharan Dhaliwal - Ode akwụkwọ, UK

29) Maria Fernanda Espinosa -OnyeisiUN General Assembly, Ecuador

31) Sister Gerard Fernandez- Roman Catholic nun, Singapore

32) Bethany Firth - 'Paralympic swimmer', UK

33) Owl Fisher - Onye ntaakụkọ, Iceland

34) Shelly-Ann Fraser-Pryce - Ọgba ọso, Jamaica

35) Zarifa Ghafari - 'Mayor', Afghanistan

36) Jalila Haider - Okaikpe, Pakistan

37) Tayla Harris - Australian rules footballer and boxer, Australia

38) Hollie - Trafficking survivor, US

39) Huang Wensi- Oti okpo, China

40) Luchita Hurtado - Nka, Venezuela

100 Women profile pictures 41 - 60

41) Yumi Ishikawa - Onye bidoro #kutoo movement, Japan

43) Aranya Johar - 'Poet', India

44) Katrina Johnston-Zimmerman - 'Anthropologist', US

46) Amy Karle - 'Bioartist', US

48) Fiona Kolbinger - Onya inyinya igwe, Germany

50) Aïssata Lam - 'Microfinance expert', Mauritania

51) Soo JungLee - 'Forensic psychologist', South Korea

52) Fei-Fei Li - Igwe na-eme ka mmadụ, US

53) Erika Lust- Ejiji, Sweden

54) Lauren Mahon - Onye meriri ọrịa kansa, UK

56) Lisa Mandemaker - 'Speculative designer', Netherlands

57) Jamie Margolin - 'Climate change activist', US

58) Francia Márquez - 'Environmentalist', Colombia

59) Gina Martin - 'Campaigner', UK

100 Women profile pictures 61 - 80

60) Sarah Martins Da Silva - 'Consultant gynaecologist/obstetrician', UK

62) Susmita Mohanty - 'Space entrepreneur', India

64) Subhalakshmi Nandi - 'Ikike ruru ụmụnwaanyị, India

65) Trang Nguyen - 'Conservationist', Vietnam

66) Van Thi Nguyen - Onye nwe ulooru na 'disability rights advocate', Vietnam

67) Natasha Noel- Yoga , India

68) Alexandria Ocasio-Cortez - Nwaanyi omeiwu, US

70) Ashcharya Peiris - 'Designer', Sri Lanka

71) Danit Peleg- 'Designer', Israel

72)Autumn Peltier - Maka miri dị ọcha, Canada

73) Swietenia Puspa Lestari - 'Diver/environmentalist', Indonesia

74)Megan Rapinoe -Onye egwu bọolụ, US

75)Onjali Rauf - Ode akwụkwo, UK

76) Charlene Ren - Mmrir di ọcha, China

77) Maria Ressa- Ntaakụko, Philippines

78) Djamila Ribeiro - Ode akwụkwo, Brazil

79) Jawahir Roble - Onye na-egbu eguregwu bọọlụ, UK/Somalia

80) Najat Saliba - Okammuta Kemistirị, Lebanon

81) Nanjira Sambuli - 'Digital equality expert', Kenya

100 Women profile pictures 81 - 100

82) Zehra Sayers - Sayencs, Turkey

84) Noor Shaker - Sayensi nke Komputa, Syria

85) Bonita Sharma - Onye mmeputa, Nepal

86) Vandana Shiva - 'Environmentalist', India

87) Pragati Singh - Dọkinta, India

88) Lyubov Sobol - Okaikpe, Russia

89) Samah Subay - okaikpe, Yemen

91) Bella Thorne - Onye Ejiji, US

92) Veronique Thouvenot - Dokinta, Chile

93) Greta Thunberg - 'Climate change activist', Sweden

94) Paola Villarreal - 'Computer programmer', Mexico

95) Ida Vitale - 'Poet', Uruguay

97) Marilyn Waring - 'Economist and environmentalist', New Zealand

98) Amy Webb - 'Futurist', US

99) Sara Wesslin - Nkaakụko, Finland

100) Gina Zurlo - Ọmụmụ ofufe, US

Photo credits: Photo copyrights: Karolina Kuras, Hans Jørgen Brun, Nicola Virzì, Sage Sohier, Christian Petersen/Getty Images, Mooreyameen Mohamad, Amelia Allen, Getty Images/Maja Hitij, UN, British Swimming, Hauser & Wirth, Oresti, Tsonopoulos, Kawori Inbe, Amal Adam, Matt Kay, Constanza Lavagna, Paula Mitre, Theo Kruse, Venura Chandramalitha, Luis Crispino/Claudia Magazine, Anders Hellberg, Graciela Buffanti, Wakophotography, IBF China, Germana Costanza Lavagna, Neal Hardie, Sharon Kilgannon, Hanna Sotelo, Sumit Kumar Singh, Päivi Mäkelä, Pimienta Films, Siddharth Das, Venura Chandramalitha, Linda Roy by Irevaphotography

Gịni ka ụmunwaanyị 100 pụtara?

BBC ụmụnwaanyị 100 ndị a ma ama kacha akwalite ma na ewepụta ihe ọhụrụ n'afo obụla ma kọọ akụko ha.

N'afọ a ka ụmụnwanyi 100 na ajụ: Kedu ka echi ga-adị ma ụmụnwaanyị bụrụ ndị ndu?

Soro anyi na Facebook, Instagram na Twitter ma cheta were #100Women.