Ndị uweojii Bulgarịa anwụchiela mmadụ isii na-akwado ịkpa oke agbụrụ

Ebe foto si, Ndị Uweojii Bulgarian
Ndi uweojii mba Bụlgarịa anwụchiela mmadu isii bụ ndi nkwado otu egwu bọọlu Bulgaria maka ikpa oke agbụrụ.

Ebe foto si, Getty Images
Agwa ọjọ a mere n'asọmpi ntozu Europa ebe ndi Briten ji ọkpụ goolu isii asataghi ma ncha were merie ndị nke Bulgaria.
N'Ọnịcha
Tanka bu mmanụ ụgbọala awụfuola ma nwuru ọkụ nke bidoro gbawa kamgbe elekere iri na abụo nke oke ụtutụ taa n'Ọnicha.

Ebe foto si, Iheanacho Chisom
Ọkụ a bidoro na 'Upper Iweka' were ruo Ọchanja nke di n'Ọnịcha.

Ebe foto si, @Followlastma
Ndị uweojii kwuru na ha amabeghi mmadụ ole ọkụ a rere, mana ha ebusoola ọkụ a ọgụ n'iji menyụọ ya mana ọ ka pere mpe fọrọ.
Aga-ebido nnyochaa ụgwọ ọnwandị ọrụ gọọmentị gbalitere

Ebe foto si, @LabourMinNG
Gọọmentị Naijiria enyela ikike ka ngalaba na-ahu maka ikwụ ụgwọ bụ 'Revenue Mobilization Commission' ka ha nyochaa ụgwọ a na-akwụ ndi gbalitere n'ọrụ gọọmentị nke gụnyere ndị Gọvanọ na ndị omeiwu.
Ọ bụ minista na-ahu maka ọrụ bụ Chris Ngige kwụru na atụmatu a bụ ụzọ a ga-esi wetuta mmefu gọọmenti na-emefụ kwa afọ.
N'Ofesi - Brexit

Ndị nnọchiteanya Iropịan Ụnion na ndị nke mba Briten ebidola mkparịta ụka maka ọpụpụ Briten na Iropịan Unịon ọzọ.
Dịka Briten hiwere ụbochị iri ato na otu nke ọktoba dịka ụbọchi ọpụpụ ha na Iropịan Union, Onyeisiala ha bụ Boris Johnson kwuola na ha ga-apụ 'ụbochi ahụ na-agbanyeghị.
Akụko ga-amasị gị
Ihe nkiri ga-amasị gị
Otu ndị ahịa a kpọrọ South-East Amalgamated Market Traders Association (SEAMATA) arịọla onyeisiala Buhari ka o mepeturu ha ụzọ maka ibupu ngwaahịa ndị ziri ezi.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi ha degara onyeisiala Buharị ụnyaahụ bụ nke onyeisi ha bụ Gozie Akudolu na odeakwụkwọ ha bụ Alex Okwudili tinyere aka na ya.

Ha kwuru na ọnụ ego ngwaahịa ndị emepụtara na Naịjirịa arịala ezigbo elu karịa aka ndị mmadụ.
O kwuru na nke a nwereike ime ka ụlọọrụ ha dị iche iche chụọ ndị na-arụrụ ha ọrụ.
Ha rịọrọ onyeisiala ka o biko lebanye anya etu a mmechi okeala ndị a ga-esi metụta ezinaụlọ ndị mmadụ na Naịjirịa.
Karịsịa ndị na onweghi ka ọ dị bụrụ ha n'ụzọ inwete nri nakwa ihe eji ebi ndụ.
Abụbụ ọrụ agaghịzị amalite taa

Ebe foto si, Peter Nnadozie/Facebook
Nke bụ eziokwu bụ taa bụ na otu jikọtara ndị ọrụ oyibo sị na ha agakwaghị agba abụbụ ọrụ ha chọbụrụ ịmalịte taa.
Otu a sị na mkparịtaụka ha na gọọmentị ga-aga n'ihu taa maka ụgwọ opekatampe iji kapịa okwu a ọnụ.
Erdogan e cheleara Amerịka aka mgba

Ebe foto si, AFP
N'ofesi, Onyeisiala mba Turkey bụ Recep Tayyip Erdogan akpọọla ekwo nkụ na ya ga ebuso Syria agha agbanyeghị aka na ntị mba Amerika dọrọ ha.
Cheta na Amerịka kwakọọrọ ndịagha ha pụọ n'okeala ahụ bụ ebe ndị Kurd na Syria na agwọkọrịta onwe ha ji mmanụ kemgbe.
Mmeru ahụ David de Gea bụ ọghọm dịịrị Manchester United

Ebe foto si, EPA











