Rivers Flooding: 'Idemmiri achụbatala agwọ n'ime ụlọ anyị'

Ebe foto si, Odogu Emman
Ndị mmadụ bi n'ụfọdụ ebe na Rivas steeti etiela mkpụ rịo ka gọọmentị were ọsọ were ije bịa nyere ha aka dịka idemmiri na-enye ha ọsọ n'obodo ha.
Ọtụtu ndị bi na Rumuokwurushi akwapụla maka mkpamkpa idemmiri na-akpa ebe ahụ.
Ka ọ dị ụgbua, ha na-eji ụgbọmmiri abata ma na-apụ n'ụlọ ha.

Otu nwaanyị bụ Beatrice Offem, onye ụlọ ya dị n'ogige obibi 'Valley of Decision' gwara onye ntaakụko BBC na kamgbe ọnwa Sepụtemba, na ha na-eji ụgbọmmiri eme njem.
Offem kwuru si "Anyị na-egbu agwọ na anụ ndị ọzọ idemmiri na-ebubata n'ime ụlọ anyị".

O kwukara sị "Mmiri a na-erute anyị n'obi, ihe anyị chọrọ bụ ezigbo ọwammiri maka na anyị enweghi ọwammiri ebe a".
O kwukwara na ha na-akwụ ndị na-akwọ ụgbọmmiri a otu narị naịra iji bufee ha.

N'aka nke ọzọ ka ndị bi n'Ahọada, Abua na Ogba Egbema, Ndoni na-ekwu na idemmiri awakpoola ha kamgbe 2017.

Ebe foto si, Odogu Emman
Baseme Akio kwuru na idemmiri a na-ebutere ha ọrịa dị iche iche dịka ịba na azụ mgbu.
O kwukwara sị na ha ahụbeghị enyemaka gọọmentị.

Ebe foto si, Odogu Emman
Ihe ndị otu gbatagbata NEMA nwere ikwu
Onyeisi ndị otu ọrụ gbatagbata bụ National Emergency Management Authority (NEMA) nke mpaghara Ndịda-Ndịda bụ Ibarakumo Walson, gwara BBC na ha achọpụtala na ọ bụ mmiri ịsọfe oke, enweghị owammiri na oke idemmiri (flash Floods) kacha ebute nsogbu.

Walson kwuru na ọ bụru na egwughị ala mmiri, ma rụọkwa ọwammiri, na ndị obodo a ga na-ata ahụhụ afọ niile.










