South East Flooding: 'Ndị bi n' ikpere mmiri ọkachasị ndị bịdebere Osimiri Naija gbabanụ ọsọ ndụ- NEMA

Idemmiri n'Enugwu

Ndị ngalaba gbatagbata nke gọọmenti etiti a kpọrọ 'National Emergency Management Agency (NEMA) n'ịchafụ, nakwa ndị nke Anambara steeti a kpọrọ State Emergency Management Agency (SEMA) amaala ọkwa ka ndị bị n'ikpere mmiri ọkachasị ndị bi nso n'Osimiri Naija kee nkwụcha ma bido n' ụtụtụ chọwa ewu ojii.

Ọkwa a bụ maka idemmiri a na-atụ anya na ọ ga-awakpo ndị bi na mpaghara ahụ.

Onye na-achịkọta NEMA nke Ọwụwa Anyanwu Naịjirịa bụ Manfred Anusim gwara BBC na ha agaala na ọbodo idemmiri ga emetụta wee gwa ha ihe ha ga-eme.

Manfred Anusim kwuru na ọ bụ nyochapụta nke odinihu ndị "Nigerian Meteorological Agency' (NiMet) mere maka mmiri ozizo na nke ndị 'Nigerian Hydrological Services Agency' (NIHSA) mere maka idemmiri ka ha ji arụ ọrụ.

Aha onyonyo, Erosion: 'Ndị ụka gbutuchara ukwu osisi mere ka idemmiri bakwute anyị'

Ọ kwuru sị: "Anyi bu ụzọ agwa ndị idemmiri a ga-akacha emetụ tupu anyị agawa ebe ndị ọzọ ọgaghị erutecha."

Anusim kwukwara na ọ bụ obodo ndị di na Anambra-North na Anambra-East ọkachasị ndị okpuruọchịchị dịka Ayamelum ka idemmiri a nwere ike imetụ karịa.

O kwukwara na ha ehiwela ebe ndị gbatagbata ga-anọ nyere ndị idemmiri a ga-emetụta aka.

Ebe ndị gbatagbata a dị n'elu ugwu nke mere na idemmiri agaghị erute ya.

Anusim mere ka BBC mata na nsogbu ha na-enwe bụ na ụfodụ ndị anaghị ekwe abịa n'ụlọ gbatagbata gọomentị hibere.

Kama n' agbanyeghị nke a, ha agwala ndị mmadụ niile bi ebe ndịa ebe ụlọ gbatagbata ndị ahụ dị.

Mapụ Idemmiri
Nkọwa foto, Mapụ Idemmiri

Akụkọ ga-amasị gị

Lee ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Idemmiri na-achọ ịchụpụ ndị mmadụ n'ụlọ n'Enugu