Onye omeiwu apụtala ụlọikpe maka ịgbọ ncha na Tunisia

Nwoke na-eche echiche

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Igbọ ncha edubanyela otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị n'ọnwụnwa na mba Tunisia.

A kpụpụrụ Zouheir Makhlouf, bụ onye ụlọomeiwu na mba ahụ e jidere n'ihe onyonyo ka ọ na-agbọ ncha n'ihu ụlọakwụkwọ, ụlọikpe ka ọ zara ọnụ ya.

Makhlouf bụ onye pati Qalb Tounes, gọrọ agọ sị na ọ bụ naanị mamịrị ka ọ na-anyụnye na karama maka ọrịa shuga ọ na-arịa.

Ihe onyonyo ahụ e kesara ọfụma na soshal midia mba ha mere ka ụmụnwaanyị mba ahụ malite ikwu maka etu ụmụnwoke si enye ha nsogbu maka nsori, nke ha kpọrọ #EnaZeda.

#EnaZeda pụtara "ma mụnwa" n'asụsụ ndị Tunisia.

I nwere kaadị njirimara (National ID card)?

Ọ bụrụ na oge kaadị njirimara nke Naịjirịa gị agafeela, mara na ị ga-ejide puku naịra atọ ị ga-eji gbata ọzọ ugbua, dịka ngalaba "National Identity Management Commission (NIMC)" na-ahụ maka ya si kwuo.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ọ bụrụkwanụ na o fuola, mara na ọ ga-eri gị puku naịra ise iji nweta ọzọ.

Mana ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ "ebe ọ bụ na a kwụghị ụgwọ gbata ya na mbụ, maka gịnị ka a ga-eji malite ịkwụ ụgwọ maka inweta ọzọ?"

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Oge ọgwụgwụ oge oruola?

Ụlọ ebe nwoke na ụmụ ya isii bi na-eche ọgwụgwụ oge

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ụlọ ebe nwoke na ụmụ ya isii bi na-eche ọgwụgwụ oge, ndị uweojii sị na nke a gbara ha gharịị

Ezinaụlọ zoro ezo na-eche mgbe ụwa ga-emebi apụtala ka afọ itoolu gafere.

Ndị uweojii mechara chọta nwoke dị afọ iri ise na asatọ nakwa ụmụntorobịa ruru isii gara kwaba n'ime okpuru ụlọ biri na-eche ọgwụgwụ oge n'obodo Drenthe dị na mba Netherlands, ka otu n'ime ha pụtara ịbịa zụrụ mmanya biya.

Ọnọdụ Uzoho

Uzoho

Ebe foto si, Getty Images

Ka ọ dị ugbua, amabeghi mgbe aka na-aghọrọ ndị Super Eagles mgbọ bụ Francis Uzoho ga-ahụ ihu poostu anya ọzọ.

Cheta na e bupuru ya n'ọgbọ egwuregwu oge Naịjirịa na Brazịl zutere ụbọchị ụka, ka ọ merụchara ahụ.

Anyị na Buhari ga-edọrịta ụka - Ndị ndu ala Igbo

Ndị ndu mpaghara ọwụwanyanwụ

Ebe foto si, Gọvanọ Ugwuanyị/Facebook

Ndị gọvanọ nakwa ndị ndu mpaghara ọwụwanyanwụ ekpebiela ị gazute onysisiala Buharị n'ụbọchị Tọzde n'ihi ọkwụ banyere ọ dị mma Ndigbo.

Mkpebi ha na-abịa dịka ha nwekwara nzuko n'Enugwu ụnyaahụ.

Onyeisioche ndị gọvanọ mpaghara ọwụwanyanwụ bụ gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti gwara ndị ntaakụkọ nke a.

Ndị so na nzuko a gụnyere gọvanọ Enugwu Ifeanyi Ugwuanyi, nke Abia bụ Okezie Ikpeazụ, osote gọvanọ Imo bụ Gerald Irona.

Nzukọ ndị ndu Igbo

Ebe foto si, Gọvanọ Ugwuanyị/Facebook

Ndị ọzọ gụnyere Enyinnaya Abaribe, Victor Umeh, Nnia Nwodo, nakwa ndị isi ụka katọlik na Metọdis bụ Callistus Onaga na Christopher Ede.

Uweojii achọpụtala ụlọ ntaramahụhụ ọzọ

Ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue maka nsogbu a na-ebo ndị ọchụehi

Ndị uweojii Katsina Steeti achọpụta ụlọ okpukperechị ọzọ ebe ekere ọtụtụ ụmụaka agbụ ma na-ata ahụhụ n'ụzọ dị iche iche na Sabon Garin dị na steeti ahụ.

Kọmishọna ndị uweojii bụ Sanusi Buba sị na ọ bụ otu nwoke a kpọrọ Bello Abdullahi Umar nwe ụlọ a nakwa ndị nọ ebe ahụ dị ogogo afọ asaa ruo afọ iri anọ.

N'ofesi

Turkish-backed Syrian fighters are pictured in the town of Ayn al-Arus

Ebe foto si, AFP

Mba Amerịka eyiela ndị mịnịsta Mba Turkey abụọ na ndị ọrụ ha egwu ịmachi ha n'ihi mwakpo ndị agha ha wakporo mpaghara ugwu Syria.

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kpọrọ ogbo ya nke Turkey bụ Recep Tayyip Erdogan n'ekwentị sị ya ka ọgba mbọ mee udo.

N'egwuregwu

Cristiano Ronaldo

Ebe foto si, Reuters

Aha nwafọ mba Pọtugal na-agba bọọlụ bụ Cristiano Ronaldo na-ada ụda maka goolu nke narị asaa ya o nyere ụnyaahụ n'asọmpi ha ndị Ukren gbara ụnyaahụ.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile