A si ndị ọwuwa anyanwụ 'Onye kpata, o rie' aguu agaghị agu Igbo.- Ndị Gọvanọ Ọwuwa-Anyanwụ
Akụkọ dị mkpa taa
Anyi nwere akuchinyere ga eme ka aguu hara igu anyị

Ndị Gọvanọ Ọwuwa-Anyanwu asaala Onyeisiala Muhammadu Buhari okwu o kwuru ka ha gaa gbaa mbọ ịkpata ego n'aka nke ha.
Onyeisiala Buhari nyere ndị gọvanọ steeti nile na Naijirịa ndụmọdụ ka ha gbaa mbọ chọta atụmatụ na usoro ha ga-eji na-enweta ego na steeti ha.
N'ọsisa ha, ndị Gọvanọ Ọwuwa-Anyanwu kwuru na akuchinyere dịka nnụ, ọla zinc na ntu simentị dị n'Owuwa -nyanwu, ga ezuru Ndiigbo ilekọta onwe ha ma wepu aguu.
Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi kwuru nkea site n'ọnụ na ekwuru ya bu Emmanuel Uzo si "ọ bụrụ na e nye ndị Gọvanọ ike iji aka ha chụọ ihe gbasara akụ dị n'ala, ihe gbasara mkpata na mmefu, ma ihe di n'ahia, ma ihe a na-ewepu ma nke na-abata abata, agụụ agaghi agụ ndị Ọwuwa-Anyanwụ".
Ha na-ekwukwa ka Gọọvmentị etiti kweta ka ndị steeti Ọwuwa-Anyanwụ nwee ikike i ji ihe ha nwere kpata aku ma na enyekwa Gọọmenti etiti oke ruru ha.
Gaanụ chọwa ego na steeti unu

Ebe foto si, Twitter/Bashir Ahmad
Onyeisiala Buhari kwuru okwu a n'ụlọ gọọmentị n'Abuja ka ọ na-ehibe ngalaba akpọrọ "National Economic Council" (NEC) ga-arụ ọrụ site n'afọ 2019 ruo 2023.
Ọ bụ Osote Onyeisiala Yemi Osinbajo ga-anọ n'isi ngalaba a.
Buhari sị ka aka ndị na-achị steeti na Naịjirịa tinye uche na nchekwa, nkuzi, ahụike nakwa ọrụ ugbo.
Ọ sị: "N'ịga n'ihu, steeti dị iche iche kwesịrị iji afọ anọ na-abịa ji chọọ ụzọ ha ga-eji nwete ego na steeti ha ma hụkwa na ọ bughi ndị mmadụ aka."
A nwuchiela nwoke ji isi mmadu agba mgbere

Ebe foto si, Getty Images
Aka akparala otu onye ojimmaebeisi nke kwuru na ọ bụ ịgba mgbere isi mmadu ka o ji mere akaọrụ.
Onyeisi ndị uweojii n' Abuja bụ Bala Ciroma kwuru nke a oge ọ na-akọpụta ihe ndị otu ya mepụtarala.
Ciroma kwuru na onye omekome ahụ aha ya bụ Mustapha Aliyu, nke gbara afọ iri abụọ na abụọ, kwuru na ọ na-ere isi nwata nwoke N170,000 ebe nke nwata nwaanyị na-ada N160,000.
Mgbe ndị uweojii nwụchịrị Aliyu, a hụrụ isi nwata nwoke gbara afọ atọ n'aka ya, ma ọ sịrị na o reela isi mmadụ anọ ndị ọzọ o gbuteburu.
Onyeisi ndị uweojii ahụ kwuru na ha ka na-achọ onye na-azụrụ isi mmadụ ndị ahụ n'aka Aliyu.
Miyetti Allah chọrọ ka e nye ha ọrụ nche Ọwụwa-Anyanwụ

Ebe foto si, AFP
Otu jịkọrọ ndị Fulani ọchịehi a kpọrọ Miyetti Allah, akpọọla oku ka ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ nye ha ikike inwe ndị ọrụ nche n'Alaigbo iji kwalite nchekwa obodo.
Ọ bụ Odeakwụkwọ otu ahụ Alhaji Baba Ngelzarma kwuru nke a n'ọgbakọ nchekwa e nwere n' Enugwu ụbọchị Tọọzdee nke otu 'South East Chambers of Commerce, Mines and Agriculture,' (SECCIMA) na otu jịkọrọ ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ jikọrọ aka were hiwe.
Ngelzarma onye kwuru na Ndi Igbo bụ ndị na-anabata ndị mbịarambịara, sị na "otu ndị nche ndị ntorobịa Fulani ga-enyere ndị ọrunchekwa, ndị ọrụnche agbataobi aka iji hụ n'obodo deere jii."
Ihe mere m jiri rachakwaa imi mzipụrụ-Trump

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Mba Amerika bụ Donald Trump kwuru na ya kwụsịrị mkpebi ịgba ogbunigwe na mba Iran ka ọ fọrọ nkeji iri n'ihi na a gwara ya na ọ ga-ata isi mmadụ otu narị na iri ise.
Amerika chọburu ịbọ Iran maka Igbatu ụgbọagha mba Amerịka ji eme nyocha.
Cameroun abaghị AFCON maka abụbọọrụ

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ehihie Fraide na-ezu, ndi otu egwu bọọlụ mba Cameroun agarubeghị mba Egypt maka asọmpi Iko Afrika n'ihi na ha na-agba abụbụ ọrụ maka ụgwọ e ji ha.
Gee ya n'ebe:
Ndị omekome na Zamfara enyela atụmatụ ha ga-esi kwụsị igbu mmadụ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii na-akọwa na ndị omekome na-akpa ajọ ike na Zamfara enyela ebumnuche ha maka ịkwụsị mkpamkpa ha.
Onyeisi ndị uweojii na Zamfara bụ Usman Nagogo sị na otu ihe ha kpatụrụ ukwu bụ na ha chọrọ ka a kwụsị igbu ndị Fulani n'ahịa. Ọzọ bụkwa ka a hapụ ha ka ha na-aga ahịa.
Usman sị na uru adịghị n'igbu otu onye Fulani ga-ebute ogbugbu mmadụ iri atọ.
N'ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Mba Amerịka amachiela ụgbọelu si mba ha ifefe n'elu ala Iran nwe.
Atụmatụ a bịara ka Amerịka na-achọ ụzọ ha ga-esi saa mgbatu Iran gbaturu ụgbọelu ha n'oshimiri 'Strait of Hormuz' dị nso na mba ahụ.
N'Egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Super Falcons awụfeela ma wụbanye n'agba nke 16, dịka Thailand nyerela ha aka, tụnyere ha azụ.
Ụmụagbọghọ a ga-ezute otu egwueregwu bọọlụ ụmụnwaanyị nke Jamanị n'obodo Grenoble ụbọchị Satọde, June 22, n'agba nke abụọ asọmpi Bekee kpọrọ 2019 "Women's World Cup".
Gee akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a:









