Lassa Fever Outbreak: Mkpamkpa Iba Lasa ataala isi mmadụ anọ

Ọkọlọtọ Iba Lasa

Ebe foto si, Getty Images

N'ahụike Ngalaba na-ahụ maka ọrịa na-efe efe bụ NCDC ekwuola na ọrịa Iba Lasa ebidola ịkpa mkpamkpa ọzọ.

N'ime ozi ha ziputere ha kọwara na mmadụ iri abụọ na tọ enwetala ya bụ ọrịa ọhụrụ na steeti gụnyere Ebonyi Imo Enugu Edo na ndị ọzọ.

Mmadụ anọ nwụkwara na steeti Edo, Bauchi nakwa Benue site n'ọrịa a.

Na ndọrọndọrọ ọchịchị,

Ganduje nke APC na Abba Kabir Yusuf nke PDP

Inec enyela elekere asatọ nke ụtụtụ ụbọcị ụka dịka oge a ga-amalite ngụko vootu na ntuliaka emegharịrị na Kano steeti.

Ebe ndị mmadụ na-etimkpu ka akagbuo ya bụ mmegharị ntuliaka n'ihi okwu mwakpo na nsogbu na-arị ibe ya elu.

Na mba ofesi,

A girl who was evacuated by boat from the isolated district of Buzi is carried by a Red Cross staff on her arrival at Samora M. Machel secondary school turned evacuation center in Beira, Mozambique, on March 21, 2019.

Ebe foto si, AFP

Ndị wụnyụrụ anya n'ajọ ifufe mmiri nke Bekee kpọrọ 'Cyclone Idai' arịala elu.

Ka ọ dị ugbua ọ fọrọ obere ihe ka ndị ndụ fụnarịrị rue narị asaa na mba Mozambik, Malawi nakwa Zimbabwe.

N'egwuregwu,

Ahmed Musa

Ebe foto si, Lars Baron - FIFA

Nkọwa foto, Ahmed Musa

Onye ọgbaa bọolụ Naịjirịa bụ Ahmed Musa ekwela ndị otu Dream Team Naịjirịa otu nde naira kwa goolu ha gbabara n'ime neeti ndị Libya mgbe ha ga-ezute onwe ha n'ụbọchị Monde.

Cheta na Libya ji ọkpụ goolu abụọ merie Dream Team nke Naịjirịa mgbe ha zutere onwe ha na Tunishia.

Akụko BBC Igbo na nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile