Anambra steeti: 'Anyị asịghị na ajọ mmụọ nọ n'ụlọ gọọmenti Anambra steeti'

Willie Obiano

Ebe foto si, James Eze Facebook

Gọọmentị Anambra ekwuola na onweghị ajọ mmụọ nọ n'ime ụlọ gọọmenti steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuchitere gọvanọ Willie Obiano bụ James Eze kwuru na akụkọ a na-efegharị abụghị eziokwu maọlị ma kwukwa na ọ bụ iduhie ndị mmadụ.

Ezeh kwuru na gọvanọ Obiano esighị ya bụ ebe emume ekpere n'imi ma ya fọrọ ịtụ ụkwụ ebe ahụ.

O kwuru na onye wepụtara akụkọ ahụ tụgharịrị ihe ụkọchukwu Prosper Amah nke Ogbaru Diocese ụka Anglican kwuru gbasara ọkụ tanka gbara n'Onitsha mgbe ọ na-ekpere Naịjirịa nakwa Anambra steeti ekpere.

N'okwu ya, " Ụkọchukwu Amah kwuru okwu a n'emume ekpere 'Annual Prayer Rally of Anambra State' nke gbadoro ụkwụ n'ọkụ gbara na nso nso n'isi ajọ mmụọ na ajọ mmadụ juru n'obodo.

Aha onyonyo, Onitsha fire: "Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?

Ezeh kwuru na odeakwụkwọ gọọmenti Anambra steeti bụ ọkammụta Solo Chukwulobelu nọ n'ọgbakọ ahụ rịọrọ ka ndị mmadụ kpe ekpere megide ndị na-eche echiche ọjọ megide Anambra steeti.

Cheta na akụkọ pụtara ụnyaahụ bụ ụbọchi abụọ nke ọnwa Nọvemba na-ekwu na gọọmenti Anambra kwuru na ajọ mmụọ juru na ime ụlọ gọọmenti steeti ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Aha onyonyo, Solomon Ukoha onye nrụputa akụrụmgwa