Nnamdi Kanu: Ohere adị ka nwa amadị a laghachite Naịjirịa?

Ọ tụrụ ọtụtụ mmadụ n'anya mgbe ọkaiwu Nnmadị Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor rịọrọ ụlọikpe arịrịọ ka ha weghachite iwu ha nyere ka ahapụ Nnamdị Kanu n'aka ebe nke Bekee na-akpọ "bail".
Cheta na Kanu mejọrọ iwu e ji tụghapụ ya mgbe ọ gbara ihe ọkpọrọ ọsọ ndụ n'afọ 2017.
Ọ bụ atụmatụ ahụ ka Maazị Ejiofor jiri rịọ arịrịọ a mana Ọkaikpe Binta Nyako, bụ onye nyeburu ohere ntọghapụ aka ebe a, kpọrọ isiekwenkụ na ya agaghị enyekwa ohere a ọzọ.
Ma kwukwa na etu obodo si kwụrụ ugbua, ọ bụ mkpọrọ ga-akara Maazị Kanu mma maka nchekwa ndụ ya.
Mana, ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ bụ ihe mere Ọkaiwu Ejiofor ji arịọ ụdịrị arịrịọ a, ọkachasị etinye uche n'ọnọdụ o jiri hapụ Naịjirịa.
Kepu kepu nlọta Maazị Kanu malitere mgbe ozi pụtara na nne ya bụ Ugoeze Nnenne Kanu alala mmụọ.
Dịka usoro omenala Igbo ji kwụrụ, nwa kwesiri ịkwa nne na nna ya.
Ọzọ bụkwa na Igbo na-achọkarị ili mmadụ na obodo ya.
Nke pụtara na ụfọdụ na-eche na a ga-ebulata ozu nne Kanu, ọkachasị etu a ọ bụ Ugoeze.
Kanu bụ onye aha ya ka ada ụda karịa n'ezinaụlọ ha, nke mere na ọ ga-abu onye ọtụtu mmadu ga-eji maka ya bịa akwamozu nne ya.
Kepu kepu a rikwara elu mgbe akụkọ pụtara na ụfọdụ ndị Eze si Abia steeti rịọrọ gọọmentị ka e nye Kanu ohere ka ọ lọta bịa lie nne ya.
Agbanyeghi na Maazị Kanu katọọrọ atụmatụ a, ajụjụ ndị mmadu were bụrụ ma Nnamdi Kanu ọ ga alọta bia lie nne ya?
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọnwa Epụrel nke 2019, Maazị Kanu sị na ya "na-alọta n'ike na-ebube".
Kedu ebe gọọmentị Naịjirịa kwu?
Ịmata nke nwereike ime, BBC Igbo gbara gọọmentị Naịjirịa ajụjụ ịmata ebumnuche ha maka nlọta Kanu.
Ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Femi Adesina sị na ọ bụ Minista mgbasaozi bụ Lai Mohammed nwere ikike ịza ajụjụ a.
Ekwentị Maazị Mohammed n'onwe ya tigidere mkpu mana ọ zaghị BBC Igbo.
Ebe ka Kanu kwụ?
Ọkaiwu Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor n'onwe ya si ka akpọghachị ya n'ime ugboro ugboro BBC Igbo kpọrọ ya.
Mana, n'arịrịọ ọ rịọrọ ụlọikpe, Nnamdị Kanu, site n'aka Ejiofor, na-ajụ gọọmentị Naijirịa ma ọ ga-echekwa ndụ ya ma ọ lọta dịka ha napụrụ ya ikike ịgbapụta onwe ya.
Nke a mere Ọkaikpe Binta jiri saa okwu ọ sara.
Kanu na onwe ya sara Ọkaikpe Nyako n'akara Twitter ya sị ka ya na ezinaụlọ ya gwara gawa ụlọ mkpọrọ iji gbanarụ ntọrọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
BBC jụrụ ndị ọnụ na-eru n'okwu maka etu okwu a siri kwụrụ ugbua.
Chidiebere Ike bụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'Igbo tinyere ọnụ n'ọkwu a ka BBC gbara ya ajụjụ.
Maazị Ike sị na gọọmentị Naijirịa anaghị erubere ụloikpe isi nke mere na ụjọ kwesiri ịtụ Nnamdi Kanu.
Ọ sị na ọ bụ onyeisiala ka ọ dịrị ihu na ndị mmadụ kwanyere ụlọikpe ụgwụ na nsọpụru dịrị ya.
O kwuru na ọ bụghị iwu na Nnamdị Kanu kwesiri ịlọta maka olili nne ya.
Maazị Ike kwuru na n'ụche ya, na Nnamdi Kanu agbaghị ọsọ kama na ọ bụ gọomentị Naijirịa chụrụ ya ọsọ.
Ọ tụrụ arọ ka Kanu nọrọ ebe ọ nọ ka oge na-aga.
Ọtụtụ ụmụ afọ Naịjirịa tinyere ọnụ na-ajụjụ BBC Igbo jụrụ banyere okwu a kwukwara dịka Maazị Ike.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
Ka ọ kwụ ugbua, Ọkaikpe Nyako ekwuola ka ulọikpe ya kwụ, ebe okwe dịzị bụ n'ọgbọ Ifeanyi Ejiofor na onye ọ na-anọchite anya bụ Maazị Nnamdi Kanu.
Kanu na onwe ya kwuru na ọ bụ "ịnweta Biafra" ka ya mkpa mgbe BBC Igbo jụrụ ya na mkparita uka emere n'afọ 2019 ma ọ ga-anabata ohere ya na gọọmentị Naịjirịa ikpezi.












