Nnamdi Kanu: 'Mgbe Naịjirịa dị njikere ikpe ya ikpe ha ekwuo'

Ebe foto si, Getty Images
Otu ọnụ na-ekwuru Indigenous People of Biafra (Ipob) na Lọndọn bụ Paul Achalla, sị na ndị Naịjirịa adịbeghi njikere ikpe onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu ikpe.
Achalla kwuru na kamgbe Naịjirịa malitere ikpe Kanu ikpe, na ọ gbaghapụtụbeghi ịbịa zara ọnụ ya n'ụlọikpe rue mgbe ndịagha bịara wakpoo ụlọ ya n'afọ 2017.
Ọ sị na kemgbe ha nụrụ na ọ nọ na Lọndọn, gịnị mere ha abịabeghi nara Briten ikike iji nwụchie ya ebe ahụ.
Na ọ bụ n'ihi na gọọmentị Naịjirịa ma na o nweghi uru dị n'isi azụ n'ebubo ha boro ya.
Ọ gara n'ihu kwuo na ụjọ adịghị Kanu n'ahụ maka ikpe ndị Naịjirịa chọrọ ikpe ya maka ndị Ipob niile kwụ ya n'azụ.
Achalla gwara BBC Igbo nke a ka ọ na-azaghachị ihe ọkaikpe Binta Nyako ji ikpe Nnamdi Kanu n'ụlọikpe kwuru sị na "ebe nwere nchekwa Kanu kwesịrị ịnọ bụ n'ụlọmkpọrọ".
Cheta na Kanu site n'aka ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor, gwara ụlọikpe na ọ dị njikere ịbịa zara ọnụ ya ma ọ bụrụ na ha ga-echekwa ya.
Mana ọkaiwu gọọmentị bụ Labaran Shuaibu ekwenyeghi na nke ahụ, bụ nke mere Ọkaikpe Nyako ji buga ikpe ruo ụbọchị iri na isii nke ọnwa Jenụwarị 2020.
Otu IS enwela onyeisi ọhụrụ

Ebe foto si, US DEPARTMENT OF DEFENSE/REUTERS
Otu na-eyi ndụ egwu a kpọrọ Islamic State (IS) na bekee kwupụtara ọnwụ onye ndu ha bụ Abu Bakr al-Baghdadi, ma kpọọ aha onye ga-anọchi anya ya.
Ndị otu a dere n'ọbaozi Telegram ha na Abu Ibrahim al-Hashemi al-Qurashi bụ onye ndu ọhụrụ ha nakwa "caliph".
Ndịagha pụrụiche mba Amerịka nyopuru Baghdadi na mpaghara nọrth-west nke Siria na ngwụcha izuụka gara aga ma wakpo ụlọ ya.
Onyeisi ha a gbabara n'ime ohere ma were ogbunigwe mgbagbuonwe gbuo onwe ya.
Tanka mmanụ ụgbọala ọzọ adaala

Ebe foto si, PoliceNG
Tanka ọzọ bụ mmanụ ụgbọala dara taa n'okporoụzọ si Ọnịcha gawa Enugwu mana ọbaghị ọkụ
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Haruna Muhammed sị na nchekwa na ndị ọgbanyụ ọkụ wuchiri ebe ahụ ozugbo ma gbochie ndị mmadụ ịbịa nso.
N'ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ewu so belata ọkụ na-agba n'ọzara akpọrọ Wildfire na Califonịa, ha gbochiri ụlọakwụkwọ (library) onyeisiala Ronald Reagan ịgba ọkụ
A sị kpọrọ ewu ndị ruru narị ise ka ha tachasịa ahịhịa ndị nkọrọ nkụ nwere ike ịba ọkụ.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Reuters
Gerard Pique na-agbara Barcelona bọọlụ sị na ndị otu ya kwere ka ghara ịkwụ ha ụgwọ mgbe o kwesiri iji hụ na ha zụrụ Neymar.
Cheta na Barcelona gbalịrị ike ha ịzụta Neymar n'aka PSG mana isi apụtaghị.
Nkeji
Ihe nkiri ga-amasị gị:











