Bournemouth vs Manchester United: Ọkpụkpụ agbadola Manchester united n'olu na Bournemouth

Ebe foto si, Getty Images
Aja juru Manchester United anya n'ụbọchị Satọdee mgbe ha zutere ndị Bournemouth n'asọmpi 'English Premier League'.
Bournemouth ji otu ọkpụ goolu kọwaara ha ihe ọkụ ji ntị oke eme.
Joshua King gosiri ihe o ji bụrụ eze mgbe ọ gbakara neetị na nkeji 45 kpọmkwem.
Nke a bụ nke mbụ mmeri mbụ Bournemouth na-emeri n'asọmpi ise ikpeazụ ha gbarala.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị niile a ma aha ha na Man Utd, onweghị onye kpara ike ka nwoke.
Naanị David De Gea mere ka ọkpụ goolu Bournemouth ji merie ghara ịkarị otu.
Man Utd bụzị ndị nke asatọ na tebulu 'EPL' ebe Bournemouth bụ ndị nke isii.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










