Southampton vs Man United: Akpịrị mmeri ka na-akpọ Man Utd nkụ

Ndị Man Utd

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ọ fọrọ obere ihe ka ndị Manchester United gbara aka pọintị taa, dịka ndị Southampton na-ele ha ọbịa chasiri ha ọkụ ike.

Goolu Daniel James nyere na nkeji 10 e ji bido bọọlụ ezughi inye ha mmeri na-agụsi ha ike kemgbe Crystal Palace gwọrọ ha ara n'izu gara aga.

Goolu a mere ya nke atọ James nyerela n'ime egwuregwu anọ ọ na-agbara Man Utd kemgbe ha zụtara ya.

Jannik Vestergaard nke Southampton ji isi tawarie neetị David de Gea na nkeji 58, iji gosi Man Utd na ha akpọtaghị ha n'ụlọ ha ịgba ha nkiri.

Goolu ahụ bụkwa nke mbụ Vestergaard na-enye kemgbe ọ gbawara n'Ịngland.

N'agbanyeghi na e mechara chụpụ Kevin Danso nke Southampton na nkeji 73, Man Utd anyụghị anwụ nke ha ji agbọ ụja.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ka ọ dị ugbua, Man Utd enwetala pọintị ise n'ime 12, nke mere ka ha nọrọ n'ogogo anọ na tebulu Premier League.

Ebe Southampton nwere pọịntị anọ.

Man Utd ga-ezute Leicester City bụ ebe nwaafọ Naịjirịa bụ Wilfred Ndidi na-agba, ụbọchị 14 nke ọnwa Septemba.