Eke adọgbuola otu nwaanyị woo ya n'olu

Ebe foto si, Getty Images
A hụrụ otu nwaanyị ka eke ka mmadụ ogo gburu ya ka gbakọ n'olu ya na steeti Indiana dị na mba Amerịka.
Ndị uweojii hụrụ Laura Hurst dị afọ 36 ka ọnaghị emegharị ahụ mgbe akpọrọ ha ka ha gbata otu ụlọ dị n'obodo Oxford.
Agwụ 140 nọ n'ime ụlọ ahụ eche na arụrụ maka idosa ha mgbe ndị uweoji ruru ebe ahụ.
A na-eche na ihe ruru 20 n'ime agwọ ndị a bu nke nwa ada Hurst.
Onye uweojii si nwe ụlọ a ihe a nọ mee bụ onyeisi ba bụ Don Munson, bụ onye ụlọ ya nọ dị nso.
Maazị Munson sị na ọnwụ Hurst bụ na mberede ma kwukwa na ya na-enye aka etu osi kwesi.
Onye uweojii aha ya bụ Kim Riley sị na onye hụrụ Hurst n'izizi kopuru eke ahụ n'olu ya mana ndị ọrụ gbata gbata ekwunyitefughi ya.
Ọ sị na ya bụ nwaanyị gara ileta agwọ ya mgbe mberede a mere.
"Ọ nwụpụtara ya bụ agwo nwere ya na-eme ihe ndi mmadu ji agwọ eme."

Ebe foto si, AFP

Akụkọ ga-amasị gị










