Lagos building collapse: Ụlọ elu adakwasịla ndị mmadụ n'Ikoyi Legọs

Ụlọ dara n'Ikoyi Legọs

Ụlọ ọzọ adala n'ebe a kpọrọ Glover court dị n'Ikoyi Legọs Steeti n'ụbọchị mbụ ọnwa Epụrel 2019 ma merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ.

Ụlọ bụ ụlọ elu ogogo abụọ a ka na-arụ arụ dara mgbe oji nkeji iri gafee elekere anọ nke ehihie.

E burula mmadụ anọ ndị achọpụtarala gawa n'ụlọọgwụ maka ị nata ọgwụgwọ ebe a ka na-agba mbọ ịzọpụta ndị ọzọ.

Ndị ọrụ gbatagbata na Legọs bụ LASEMA n'ịchafụ na ndị ọzọ nọ ebe ahụ ịhụ na-azọpụtara ndị mmadụ tọrọ n'ime ụlọ a.

Ndị mmadụ na-enye aka ịzọpụta ndị tọrọ n'ime ụvụrụ aja

Ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ a gwara BBC na ndị otu ha nọ n'okpuru ụlọ ahụ na-ehi ụra mgbe ọ dakwasịrị ha.

Ọ sị na ha enweteghi ụgbọala Katapila ga-enyeaka ibọlite ụvụrụ aja ndị ahụ ọsịsọ ruo mgbe ihe dịka awa atọ gachara.

Ndị ọrụ gbatagbata LASEMA

N'ofesi

Ụmụnwaanyị na-eme ngagharịiwe na Spen

Ebe foto si, Getty Images

Ụmụnwaanyị emeela ngagharịiwe na Spen maka ikpe sị na ọ bụ naanị mmetọ ka ụmụnwoke ise metọrọ nwata nwaanyị dị afọ iri na anọ na ọ bụghị wakpo n'ike.

A tụrụ mmadụ ise a mkpọrọ afọ iri ruo afọ iri na abụọ ebe ntaramahụhụ mwakpo n'ike bụ afọ iri na ise ruo afọ iri abụọ.

N'egwuregwu

Granit Xhaka

Ebe foto si, Getty Images

Onye nchịkọta otu Arsenal bụ Unai Emry sị na Granit Xhaka agaghị eso gbaa bọọlụ ha na Wolves na Satọde.

Xhaka wesara ndị nkwado Arsenal iwe n'ihi ụzụ ha tụrụ ya n'isi mgbe ewepuru ya n'asọmpị ha na Crystal Palace n'izuụka gara aga.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Nollywood: E gwuru m chandum mgbe m bidoro - Obi Emelonye

'Operation Positive ID dị ka Apartheid' - Femi Falana

Onyeagha na-enyocha ndị nọ n'elu ọgbatumtum

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeagha na-enyocha ndị nọ n'elu ọgbatumtum

Onye ọkaiwu ama ama bụ Femi Falana akpụpụla ndịagha Naijirịa ụlọikpe maka emume nyocha ha kpọrọ "Operation Positive ID".

Falana kwuru na ndị agha chọrọ ịnapụ ndị uweojii ọrụ ha ma sị kwa na ọtụtụ ndị Naijirịa enweghị akwụkwọ njirimaraonye ha ga-ewpụta ma ajụọ ha.

O kwukara na emume a bụ ụzọ ndịagha ga-eji imaja ma na-akpagbụ ndị Naijirịa

Na Legọs

Onye etinyere ịga n'ụkwụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye etinyere ịga n'ụkwụ

Ndị uweojii na Legos azọpụtala mmadụ iri na abụọ ejikpara n'ụlọ ekpere dị na Isheri Osun.

Atụrụ ụfọdụ n'ime ndị ịga kamgbe 2014 nke mere na ha enweghi ike ị ga ije.

Nke a na enwete ya ụlọ ụdị a anọ achopụtara na Naịjirịa kemgbe ọnwa abụọ.

A hụla ebe eji ndị mmadụ, ọkachasị ụmụaka, na Kaduna steeti nakwa otu na Katsina steeti

N'Ofesi

Ụlọ Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụlọ Donald Trump si kwapụ

Ndị ọchịchị na New Yorka si Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ga nke ọma dịka ọ kwapụrụ n'ụlọ ya bụ Trump kwaga Obodo Florida.

Trump kwuru na nke a bụ maka ajọ agwa ndị ọchịchị New York na-akpasa ya na agbanyeghị nnụkwụ ụtụ isi ọ na-atụ.

Nke a na-abịa ka ndị Ụlọ Omeiwu obele na Amerịka malitere njem ịchụtụ Trump N'ọkwa.

N'Egwuregwu mgba

Tyson Fury na Braun Strowman

Ebe foto si, WWE

Nkọwa foto, Tyson Fury jị ọkpọ kụpụ Braun Strowman

O jị ọkpọ etigbu agụ bụ Tyson Fury egosila ihe o ji bụrụ dike dịka ọ gbara mgba n'emume Crown Jewel nke ndị WWE ma merie nwokeike bụ Braun Strawman.

Tyson na-akwadozi maka ọkpọ ya na Deontay Wilder ga-esu n'ọnwa Febụwarị 2020.

N'Egwuregwu bọolụ

Frank Lampard

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Chelsea agaala ụlọikpe maka mmachị FIFA machiri ha

FIFA amachiela otu egwu bọolụ Chelsea igo maọbụ ire mmadụ ruo ọnwa Janụwarị afọ 2020 maka na ha daara iwu ruru otu narị na iri ise metụtara mmadụ iri asaa na otu na-agbara ha bọọlụ.

Akụko ga-amasị gị

Gee Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri ga-amasị gị

Aha onyonyo, Fisayo Soyombo: Ihe mere o ji zoo ezoo mee nnyocha n'ụlọmkpọrọ