US-North Korea: Trump agaala ije na ndagwuru ugwu olulu ọnwụ

Ebe foto si, AFP
Donald Trump abụrụla onyeisiala mba Amerịka mbụ nọ n'ọchịchị ga-aba na mba Saụt Korịa mgbe o zutere Kim Jong-un n'agbata obi Nọt na Saụt Korea.
Trump na ogbo ya nke Nọt Korịa kwere n'aka tupu ha e kwuo okwu n'ihe ruru otu awa n'ime agbagha bụ 'Demilitarized zone' na Bekee.
Mba abụọ ndi kpebiri ihiwe otu ga-amalite mkparịta ụka ọzọ banyere ngwaagha nuklịa nke kwụsịrịla ọtụtụ ọnwa.
Nzuko ha abụọ mere banyere ngwaagha nuklịa kwụsịrị n'ọnwa Febụwarị.

Ebe foto si, Reuters
Ndị nkatọọ kwuru na nzụkọ a bụ nke ugboro atọ ga-adị n'etiti ndị isi abụọ a bụ amansị a na-eme na ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ha kwuru na Nọt Korịa ka kwesiri igosi na ha adịla njikere ịkwụsị nrụpụta ngwaagha nuklịa.

Ebe foto si, Reuters
Nzuko a dịka ha mere mgbe Trump kpọrọ Kim oku site n'akara Twitter ya n'ụbọchị Satọde, ha na-ekwe n'aka dịka ha kwụ n'ahịrị kewara mba Korịa abụọ ndị a.
N'atugughi oge, Trump gafere ma banye na Nọt Korịa, iji mee akụkọ a dara ụda.
"Ọ dị mma ịhụ gị ọzọ. atụghị m anya izute gị ebe a," Ihe Kim gwara Trump site n'ọnụ onye ntapịa na nzuko a gbara n'igwe TV mbaụwa.
"Nnukwu oge" dịka Trump zaara, "Nnukwu ọganihu."








